Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 19:20 - Bible Nso

20 biko, le, obodo a di nso ib͕alaga n'ebe ahu, nke ahu bu kwa obodo ntà: biko, ka m'wepuga onwem je ebe ahu, (ọ̀ bughi obodo ntà?) nkpuru-obim gādi kwa ndu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Lee obodo dị nso nke m nwere ike ịgbaga. Ọ bụ obodo dị nta. Kwere ka m gbaga nʼebe ahụ. Obodo nta ka ọ bụ, ọ bụghị ya? Aga m echebekwa ndụ m na ya.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 19:20
9 Iomraidhean Croise  

Biko, si na ọ bu nwa-nnem nwayi ka i bu: ka ọ we dirim nma n'ihi gi, ka nkpuru-obim we di kwa ndu n'ihi gi.


biko, le, orù-gi ahutawo amara n'iru gi, i mewo kwa ka ebere-gi di uku, nke i meworom n'idebem ndu; mu onwem apughi kwa iwepuga onwem je ugwu, ka ihe ọjọ ahu we ghara irapara n'arum, m'we nwua:


Ọ si ya, Le, m'huwo kwa gi iru-ọma n'okwu a, na m'gaghi-akwatu obodo a nke i kwuworo okwu bayere ya.


Lot we si na Zoa rigo, biri n'ugwu ahu, ya na umu-ya ndinyom abua; n'ihi na ọ turu egwu ibi nime Zoa: ọ we biri n'ọb͕à, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom abua.


Ka nkpuru-obim di ndu, ọ gēto kwa Gi; Ka ikpé-Gi nile ye-kwa-ram aka.


Tọnu nti-unu n'ala, biakutem; nurunu, nkpuru-obi-unu ewe di ndu: Mu na unu gāb͕a kwa ndu, bú ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, bú ebere nile kwesiri ntukwasi-obi nke emere Devid.


Jeremaia we si, Ha agaghi-enye gi n'aka-ha. Biko, ge nti olu Jehova, n'ihe nke mu onwem nāgwa gi: o we diri gi nma, nkpuru-obi-gi gādi kwa ndu.


Àgāfù opì-ike n'obodo, ndi-ya aghara ima jijiji? ihe ọjọ, ọ̀ gādi n'obodo, ma Jehova emeghi ya?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan