Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 19:19 - Bible Nso

19 biko, le, orù-gi ahutawo amara n'iru gi, i mewo kwa ka ebere-gi di uku, nke i meworom n'idebem ndu; mu onwem apughi kwa iwepuga onwem je ugwu, ka ihe ọjọ ahu we ghara irapara n'arum, m'we nwua:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 ohu unu achọtala amara nʼihu unu, unu egosila m obi ebere dị ukwuu site nʼichebe ndụ m. Ma agaghị m enwe ike gbalaga nʼugwu ka mbibi a ghara ịdakwasị m, m nwụọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 19:19
20 Iomraidhean Croise  

Biko, si na ọ bu nwa-nnem nwayi ka i bu: ka ọ we dirim nma n'ihi gi, ka nkpuru-obim we di kwa ndu n'ihi gi.


Lot we si ha, É-è, biko, onye-nwem:


biko, le, obodo a di nso ib͕alaga n'ebe ahu, nke ahu bu kwa obodo ntà: biko, ka m'wepuga onwem je ebe ahu, (ọ̀ bughi obodo ntà?) nkpuru-obim gādi kwa ndu.


Lot we si na Zoa rigo, biri n'ugwu ahu, ya na umu-ya ndinyom abua; n'ihi na ọ turu egwu ibi nime Zoa: ọ we biri n'ọb͕à, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom abua.


Josef we huta amara n'iru ya, we jere ya ozi: ọ me ya onye nēlekọta ulo-ya anya, ọ bu kwa ihe nile o nwere ka o tiyere n'aka-ya.


Ma Noa hutara amara n'iru Jehova.


Ha gāsi kwa, Ọ bu n'ihi na ha rapuru Jehova, bú Chineke-ha, Onye mere ka ndi bu nna-ha si n'ala Ijipt puta, ha we jide chi ọzọ, kpọ isi ala nye ha, fè ha òfùfè: n'ihi ya ka Jehova meworo ka ihe ọjọ a nile biakwasi ha.


O we za ha, si, Unu ọb͕ọ nēnweghi okwukwe, rùe ole mb͕e ka Mu na unu gānọ? rùe ole mb͕e ka M'gānagide unu? unu kutaram ya.


Ndi-ab͕ata-obi-ya na ndi-ikwu-ya we nu na Onye-nwe-ayi mere ka ebere-Ya di uku n'ebe ọ nọ; ha we so ya ṅuri ọṅu.


Gini kwa ka ayi gēkwu n'ile ihe ndia anya? Ọ buru na Chineke diri ayi, ònye nēmegide ayi?


Iwem gādi kwa ọku megide ha n'ubọchi ahu, M'gārapu kwa ha, zopu irum n'aru ha, ha gābu kwa ihe agēri eri, ọtutu ihe ọjọ na ahuhu gāchọta kwa ha; ha gāsi kwa n'ubọchi ahu, Ọ̀ bughi n'ihi na Chineke-ayi anọghi n'etiti ayi ka ihe ọjọ ndia chọtaworo ayi?


Devid we si obi-ya. Ub͕u a agēkpochapum otù ubọchi site n'aka Sọl: ọ dighi ihe dirim nma kari iwepugasi onwem ba n'ala ndi Filistia; Sọl agaghi-atukwasi kwa obi-ya n'arum, ichọm ọzọ n'ókè-ala nile nke Israel: m'gēwepuga kwa onwem n'aka-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan