Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 19:1 - Bible Nso

1 Abua nime ndi-mọ-ozi ahu we biarue Sọdọm n'anyasi; ma Lot nānọdu n'ọnu-uzọ-ama Sọdọm: Lot we hu ha anya, bilie izute ha, ọ da kpue iru-ya n'ala,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Nʼoge anyasị, ndị mmụọ ozi abụọ ahụ bịarutere Sọdọm. Lọt nọ ala nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ. Mgbe ọ hụrụ ha, o biliri jekwuru ha, hulata ihu ya nʼala.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 19:1
15 Iomraidhean Croise  

Ma ndia bu osuso-ọmumu Tira. Tira muru Abram na Nehoa na Heran; Heran muru Lot.


Abram biri n'ala kenean, ma Lot biri n'obodo nke Buruburu-ala ahu, ropu ulo-ikwū-ya je rue Sọdọm.


Ndikom ahu we si n'ebe ahu bilie, le anya n'ebe Sọdọm di: Abraham nēso kwa ha je idupu ha.


Ndikom ahu we si n'ebe ahu che iru je n'uzọ Sọdọm: ma Abraham nēguzogide n'iru Jehova.


Ndikom ahu we setipu aka-ha, me ka Lot bakute ha n'ulo, ha we mechie uzọ.


si, Biko, le, ndi-nwem, biko, sinu n'ije-unu wezuga onwe-unu bà n'ulo orù-unu, nọ ọnọdu-abali, sa kwa ukwu-unu, unu gēbili n'isi-ututu, la, Ha si, É-è, kama ọ bu n'amá ka ayi gānọ ọnọdu-abali.


Abraham we kpọ isi ala n'iru ndi ala ahu.


Josef we me ka ha puta n'etiti ikperè-ya abua: ọ kpọ isi ala, kpuchie iru-ya n'ala.


Mb͕e m'puru je rue ọnu-uzọ-ama n'akuku obodo, Mb͕e m'nēdozi ebe-ọnọdum n'amá,


Ọ bughi n'èzí ka ọbìa nānọ ọnọdu-abali; Anam emeghe ọnu-uzọm n'ebe uzọ-amá di.


Ndi nānọdu n'ọnu-uzọ-ama nātughari uche bayerem; Aghọwokwam abù nke ndi nāṅu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya nābù n'ikpọ ubọ-akwara.


Otú ahu dika emere n'ubọchi Lot; ha nēri ihe, ha nāṅu ihe-ọṅuṅu, ha nāzú, ha nēre, ha nāku ihe n'ubi, ha nēwu ulo;


Unu echezọla ile ndi-ọbìa nke-ọma: n'ihi na ufọdu esitewo na nka le ndi-mọ-ozi ọbìa nāmaghi ama.


Ma Boaz rigoro rue ọnu-uzọ-ama, nọdu n>ebe ahu: ma, le, onye-nb͕aputa ahu nke Boaz kwuru okwu bayere ya n=agabiga; ọ kpọ aha-ya, si, Wezuga onwe-gi, nọdu ala n>ebe a. O we wezuga onwe-ya, nọdu ala.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan