Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 18:8 - Bible Nso

8 O were kwa miri-ara-ehi nke raru araru, na miri-ara-ehi, na nwa-ehi ahu nke o doziri, o che ha n'iru ha; ya onwe-ya we nēguzo n'akuku ha n'okpuru osisi ahu, ha we rie.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Emesịa, Ebraham buuru mmiri ara ehi nke rahụrụ arahụ, na mmiri ara ehi, na anụ ahụ a kwadoro dozie ha nʼihu ndị ọbịa ahụ. O guzokwara nso nso ebe ha nọ nʼokpuru osisi ahụ mgbe ha na-eri nri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 18:8
17 Iomraidhean Croise  

Abraham we b͕aga n'ìgwè ehi ya, were nwa-ehi nke anu-aru-ya nākaghi aka nke di kwa nma, nye okorọbia nējere ya ozi; o me ngwa idozi ya.


Ha si ya, Òle ebe Sera, bú nwunye-gi, nọ? Ọ si, Le, ọ nọ n'ulo-ikwū.


O rugide ha nke-uku; ha we si n'ije-ha wezuga onwe-ha jekuru ya, ba n'ulo-ya; O we mere ha oké oriri, sie achicha ekoghi-eko, ha rie.


Ewe me ndikom ufọdu n'ubọchi ahu ka ha buru ndi nēlekọta ime-ulo nile nke idebe àkù, na idebe àjà-nbuli nile, na ibede nkpuru mbu, na idebe otù uzọ n'uzọ iri nile, ichikọbata nime ha, dika ubi obodo nile si di, òkè nile nke iwu nyere ndi-nchu-àjà na ndi Livai: n'ihi na ọṅù Juda di n'ihi ndi-nchu-àjà na n'ihi ndi Livai, bú ndi nēguzo eguzo.


Miri-ara-ehi raruru araru na manu-aṅu ka nwa-okoro ahu gēri, mb͕e ọ mara iju ihe ọjọ na irọputa ezi ihe.


ọ gēru kwa, site n'ọtutu miri-ara ha gāb͕a, na ọ gēri miri-ara raruru araru: n'ihi na miri-ara raruru araru na manu-aṅu ka onye ọ bula nke fọduru n'etiti ala nka gēri.


Ngọzi nādiri ndi-orù ahu, ndi, mb͕e onye-nwe-ha gābia, ọ gāhu ka ha nēche nche: n'ezie asim unu, na ọ gēke onwe-ya ihe-ọkiké n'úkwù, me ka ha nọdu na nri, ọ gābia kwa jere ha ozi.


nke nāgaghi-asi kwa ya kama nke ahu, Dozie ihe m'gēri na nri-anyasi, ke kwa ihe-ọkiké n'úkwù-gi, nējerem ozi, rue mb͕e m'risiri ṅu kwa; ma emesia gi onwe-gi gēri ṅu kwa?


O we rue, mb͕e Ya na ha nọdusiri na nri, na O were ob͕e achicha, gọzie ya, nyawa ya, we nēnye ha.


O we nara ya, rie n'iru ha.


Ya mere ha siri Ya nri-anyasi n'ebe ahu: Mata nēje kwa ozi; ma Lazarọs bu otù onye n'etiti ndi Ya na ha nọduru na nri.


Ọ bughi ndi-Ju nile ka egosiri Ya, kama ọ bu ndi-àmà Chineke buru uzọ rọputa, bú ayi onwe-ayi, ndi soro Ya nēri nāṅu kwa mb͕e O siri na ndi nwuru anwu bilie.


N'ihi na unu onwe unu, umu-nnam, ka akpọrọ ka unu nwere onwe-unu; nání unu ewerela inwe-onwe-unu ahu nye ka ọ buru ihe anu-aru-unu gēji me ihe kama werenu ihunanya burita orù ibe-unu.


Miri-ara nke raru araru nke ìgwè ehi, na miri-ara nke ìgwè ewu na aturu, Ya na abuba umu-aturu, Na ebulu àb͕ọ̀ Beshan, na ewu, Tiyere abuba obi ọka wheat; Ọbara nkpuru-vine ka i nāṅu kwa, bú manya-vine.


Le, anameguzo n'ọnu-uzọ, nāku kwa aka: ọ buru na onye ọ bula anu olum, meghe kwa uzọ, M'gābakute ya, so kwa ya ri nri-anyasi, ya onwe-ya gēsokwam rie.


Manoa we si mọ-ozi nke Jehova, Biko, kwe ka ayi b͕ochie gi, ka ayi we dozie nwa-ewu n'iru gi.


Miri ka Sisera riọrọ, miri-ara-ehi ka ọ nyere ya; O weta nso ya miri-ara-ehi nke raru araru n'ọkwa ndi di ebube.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan