Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 18:27 - Bible Nso

27 Abraham we za, si, Biko, le, ejisiwom ike igwa Onye-nwe-ayi okwu, mu onwem, nke bu ájá na ntu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Ebraham kwukwara ọzọ sị, “Ugbu a m nwere ike kwuwapụta okwu nʼihu Onyenwe anyị, mụ onye bụ naanị aja na ntụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 18:27
18 Iomraidhean Croise  

eleghi anya madu ise agaghi-adi n'ọgu ndi ezi omume abua na iri ahu: Ì gēbibi obodo ahu nile n'ihi madu ise ahu nādighi ya? Ọ si, M'gaghi-ebibi ya, ma M'chọta n'ebe ahu ọgu abua na ise.


Jehova, bú Chineke, we were ájá sitere n'ala kpuọ madu, O we kuo ume ndu nye n'oghere-imi-ya abua; madu ahu we ghọ nkpuru-obi di ndu.


n'ọsusọ iru-gi ka i gēri nri, rue mb͕e i gālata n'ala; n'ihi na esiri na ya weputa gi; n'ihi na ájá ka i bu, ọ bu kwa ájá ka i gālata.


M'we si, Chinekem, ihere nēmem, irum nwughari-kwa-ra n'ihi ihere, iweliri Gi irum elu, Chinekem: n'ihi na ajọ omume-ayi bara uba kari isi-ayi elu, ikpe-ọmuma-ayi aghọwo kwa ihe uku rue elu-igwe.


Ọ tubàwom n'apiti, M'we yie ájá na ntu.


Ò gesi kwa aṅa ghara ibo kari ndi bi n'ulo urọ? Nke ntọ-ala-ha di n'ájá, Ndi anāzọpia azọpia dika nla.


Jehova, gini ka madu bu, nke I nāmara ya? Na nwa nke madu, nke I nēchè èchìchè bayere ya?


Gini ka madu bu, na I nēcheta ya; Na nwa nke madu, na I nēleta ya?


Moses we chọ ime ka iwe Jehova, bú Chineke-ya, dajua, ọ si, Jehova, n'ìhi gini ka iwe-Gi di ọku megide ndi-Gi, nke I meworo ka ha si n'ala Ijipt puta n'ike uku na n'aka di ike?


ájá ewe laghachi n'ala dika o si diri, mọ alaghachikuru kwa Chineke Onye nyere ya.


M'we si, Ahuhu nādirim, n'ihi na alawom n'iyì; n'ihi na onye eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ruru árú ka m'bu, ọ bu kwa n'etiti ndi eb͕ub͕ere-ọnu-ha ruru árú ka m'nēbi: n'ihi na ọ bu Eze-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ka anyam abua huworo.


Ma ab͕ua a, Jehova, Nna-ayi ka I bu: ayi onwe-ayi bu urọ, Gi onwe-gi bu onye nākpu ayi; ọlu aka-Gi ka ayi nile bu.


O we turu ha ilu izí ha na ha aghaghi ikpe ekpere mb͕e nile, na ighara ikwe ka ike gwu ha;


Ma mb͕e Saimon Pita huru ya, o we da n'ala n'ikperè Jisus, si, Si n'ebe m'nọ pua; n'ihi na abum onye-nmehie, Onye-nwe-ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan