Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 18:23 - Bible Nso

23 Abraham we biarue nso, si, Ọ̀ gābu ezie na I gēkpochapu ndi ezi omume tinyere ndi nēmebi iwu?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Ebraham jeruru Onyenwe anyị nso jụọ ya sị, “Uche gị ọ bụ ikpochapụ ndị ezi omume na ndị ajọ omume?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 18:23
15 Iomraidhean Croise  

Eleghi anya ọgu ndi ezi omume abua na iri di n'obodo ahu: ọ̀ gābu ezie na i gēkpochapu ebe ahu ghara ib͕aghara ya n'ihi ọgu ndi ezi omume abua na iri nọ nime ya?


Ya buru Gi ihe-árú ime dika ihe a si di, ime ka onye ezi omume so onye nēmebi iwu nwua, o we buru na dika ndi ezi omume si di, otú a ka ndi nēmebi iwu di; ya buru Gi ihe-árú: Onye-ikpé uwa nile, Ọ̀ gaghi-eme ihe ekpere n'ikpe?


Ma Abimelek akābiaghi nso ya: ọ we si, Onye-nwe-ayi, Ọ̀ bu kwa mba nke nēme ezi omume ka I gēb͕u?


Devid we gwa Jehova okwu, mb͕e ọ huru mọ-ozi ahu nke nētib͕u ndi Israel, ọ si, Le, mu onwem emehiewo, mu onwem emewo kwa ajọ omume: ma ìgwè aturu ndia, gini ka ha mere? biko, ka aka-Gi digidem, digide kwa ulo nnam.


Ọzọ, onye nākpọ ezi ikpé asì, ọ̀ gāchi achi? Ma-ọbu ì gāma Onye ezi omume di ike ikpe?


Chineke, Ọ̀ neme ka ikpé b͕agọ ab͕agọ? Ma-ọbu Onye Nke puru ime ihe nile, Ọ̀ nēme ka ezi omume b͕agọ ab͕agọ?


Ma mu onwem, ibiaru Chineke nso dim nma: Edowom ebe-nb͕abàm n'Onye-nwe-ayi, bú Jehova, Ka m'we kọ akukọ bayere ije-ozi-Gi nile.


I gānọpuru okwu-ugha n'ebe di anya; eb͕u-kwa-la onye ikpé nāmaghi na onye ezi omume: n'ihi na adighm-agu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume.


Ọzọ, onye-ebube nke Jekob gābu onye sitere na ya, onye nāchi ya gēsi kwa n'etiti ya puta; M'gēme kwa ka ọ biarue nso, o we biakutem nso: n'ihi na ònye ka onye a bu nke nọworo obi-ya mbé ibiakutem nso? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ha we da kpue iru-ha n'ala, si, Chineke, bú Chineke nke mọ nile na anu-aru nile, bú madu, nwere, asi na otú nwoke emehie, Ì gēwesa kwa nzukọ a nile iwe?


ka ayi were obi ezi-okwu biarue nso nime nkwezu nke okwukwe, buru kwa ndi efesaworo ọbara n'obi-ayi pua n'ajọ akọ-na-uche, ndi asachawo-kwa-ra aru-ayi na miri di ọcha:


Ya mere, nēkwuputanu nmehie nile unu gwarita ibe-unu, nēkpe kwa ekpere n'ihi ibe-unu, ka ewe me ka aru di unu ike. Aririọ nke onye ezi omume di ike nke-uku n'ilusi-ọlu-ike-ya.


Elaija bu madu yiri ayi n'aru-ya, o we kpesie ekpere ike ka miri ghara izo; miri ezoghi kwa n'ala arọ atọ na ọnwa isi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan