Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 18:22 - Bible Nso

22 Ndikom ahu we si n'ebe ahu che iru je n'uzọ Sọdọm: ma Abraham nēguzogide n'iru Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Mgbe ahụ, ndị ikom abụọ nʼime ha gawara Sọdọm. Ma Ebraham nọ na-eguzo nʼihu Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 18:22
11 Iomraidhean Croise  

Ndikom ahu we si n'ebe ahu bilie, le anya n'ebe Sọdọm di: Abraham nēso kwa ha je idupu ha.


Jehova we si, Mu onwem, M'nēzonari Abraham ihe Mu onwem nēme;


Abua nime ndi-mọ-ozi ahu we biarue Sọdọm n'anyasi; ma Lot nānọdu n'ọnu-uzọ-ama Sọdọm: Lot we hu ha anya, bilie izute ha, ọ da kpue iru-ya n'ala,


Abraham we bilie n'isi-ututu je ebe ahu nke o guzorori n'iru Jehova:


O we si na O gēkpochapu ha, Ma ọ buru na Moses, bú onye Ọ rọputaworo, eguzoghi na ntiwa ahu n'iru Ya, Ime ka ọnuma-Ya si n'ibibi ha laghachi.


Jehova we sim, Ọ buru na Moses na Samuel eguzo n'irum, nkpuru-obim agaghi-adi n'ebe ndi nka nọ: chupu ha n'irum, ka ha pu kwa.


Àgākwughachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe? n'ihi na ha egwuworo nkpuru-obim olùlù. Cheta nguzo m'guzoro n'iru Gi ikwu ezi ihe bayere ha, ime ka ọnuma-Gi si n'aru ha laghachi.


M'we chọ otù onye n'etiti ha, onye gaje ib͕a ogige, guzo kwa na ntipú n'irum n'ihi ala-ya, ka M'we ghara ibibi ya: ma achọtaghm.


Ma, ebe o juputara na Mọ Nsọ, ọ legide anya n'elu-igwe, we hu ebube Chineke, na Jisus ka Ọ nēguzo n'aka-nri Chineke,


Ya mere ihe mbu m'nādusi ọdu ike bu, ka anāriọ aririọ, kpe kwa ekpere, riọ kwa aririọ anāriọrọ ndi ọzọ, kele kwa ekele, n'ihi madu nile;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan