Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 18:1 - Bible Nso

1 Jehova we me ka ọ hu Ya anya n'etiti osisi terebinth nke Mamre, mb͕e ya onwe-ya nānọdu n'ọnu-uzọ ulo-ikwū-ya n'ikpo-ọku nke ehihie;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Onyenwe anyị gosiri Ebraham onwe ya nʼakụkụ osisi ukwu dị na Mamre, mgbe Ebraham nọdụrụ ala nʼihu ụlọ ikwu ya, nʼetiti ehihie.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 18:1
17 Iomraidhean Croise  

Jehova we me ka Abram hu Ya anya, Ọ si, Nkpuru-gi ka M'gēwere ala nka nye: ọ we wuere Jehova, bú Onye ahu Nke mere ka ọ hu Ya anya, ebe-ichu-aja n'ebe ahu.


Abram we ropu ulo-ikwū-ya, bia biri n'etiti osisi terebinth nke Mamre, nke di nime Hebron, o wuere Jehova ebe-ichu-aja n'ebe ahu.


Onye b͕apuru ab͕apu we bia gosi Abram, bú onye-Hibru: ma ya onwe-ya bi n'etiti osisi terebinth nke Mamre, bú onye-Amorait, nwa-nne Eshkol, na nwa-nne Ana; ndi ahu bu kwa ndi ha na Abram di n'ọb͕ub͕a-ndu.


Mb͕e ihe ndia gasiri, okwu Jehova ruru Abram nti n'ọhù, si, Atula egwu, Abram: Mu onwem bu ọta diri gi, ugwọ-ọlu-gi riri nne nke-uku.


Ọ we rapu ikpayere ya uka, Chineke we si n'ebe Abraham nọ rigo.


Ndikom ahu we si n'ebe ahu che iru je n'uzọ Sọdọm: ma Abraham nēguzogide n'iru Jehova.


Abraham we si n'ebe ahu bulie ije n'uzọ ala Negeb, biri n'etiti Kedesh na Shua; ọ we nọ dika ọbìa nime Gera.


Jehova we me ka ọ hu Ya anya, Ọ si, Aridala n'Ijipt; biri n'ala ahu nke M'gāsi gi biri:


Jekob we biakute Aisak, bú nna-ya, na Mamre, bú Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron), ebe Abraham na Aisak nọrọ dika ọbìa.


Jekob we si Josef, Chineke Nke puru ime ihe nile mere ka m'hu Ya anya na Luz n'ala Kenean, Ọ gọziem,


N'abali ahu ka Chineke mere ka Solomon hu ya anya, O we si ya, Riọ ihe M'gēnye gi.


Moses we za, si, Ma, le, ha agaghi-ekwem, ha agaghi-ege kwa nti n'olum: n'ihi na ha gāsi, Jehova emeghi ka i hu Ya anya.


O we si, Umu-nnam na ndi bu nnam, nurunu. Chineke nke ebube mere ka nna-ayi Abraham hu Ya anya, mb͕e ọ nọ na Mesọpọtemia, mb͕e ọ kēbighi na Heran,


Okwukwe ka o ji biri dika ọbìa n'ala nke ekwere ya-ri na nkwa, dika ala nābughi nke aka ya, ebe o biri n'ulo-ikwū, ya na Aisak na Jekob, ndi soro ya nēketakọ otù nkwa ahu:


Unu echezọla ile ndi-ọbìa nke-ọma: n'ihi na ufọdu esitewo na nka le ndi-mọ-ozi ọbìa nāmaghi ama.


O rue, mb͕e Joshua nọ n'akuku Jeriko, na o weliri anya-ya abua, we hu, ma, le, otù nwoke nēguzo na ncherita-iru ya, mma-agha-ya amiputara amiputa di n'aka-ya: Joshua we jekuru ya, si ya, Ọ̀ bu ayi ka i diri ma-ọbu ndi nēmegide ayi?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan