Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 17:6 - Bible Nso

6 M'gēme kwa ka i mua ọmùmù nke-uku nke-uku, M'gēme kwa ka i ghọ mba di iche iche, ndi-eze gēsi kwa nime gi puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Aga m eme gị ka ị mụbaa nke ukwuu. Aga m eme ka ị ghọọ ọtụtụ mba dị iche iche, ndị eze ga-esitekwa na gị pụta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 17:6
15 Iomraidhean Croise  

M'gēme kwa ka nkpuru-gi di ka ájá nke ala: ya bu na, ọ buru na madu puru iguta ájá nke ala, agāguta kwa nkpuru-gi.


M'gāgọzi ya, ọzọ kwa, M'gēnye gi nwa-nwoke site na ya: M'gāgọzi kwa ya, ọ gāghọ kwa mba di iche iche; ndi-eze nke ndi di iche iche gēsite na ya di.


Ishmael kwa, anurum olu-gi bayere ya: le, agọziwom ya, M'gēme ka ọ mua ọmùmù, M'gēme kwa ka ọ ba uba nke-uku nke-uku; ndi-isi iri na abua ka ọ gāmu, M'gēme kwa ya ka ọ ghọ mba uku.


Mu onwem, le, ọb͕ub͕a-ndum di n'ebe i nọ, i gāghọ kwa nna nke ìgwè mba.


O si n'ebe ahu kwapu, gwue olùlù-miri ọzọ; ma ha eseghi okwu bayere ya: ọ kpọ aha-ya Rehobot, si, N'ihi na ub͕u a Jehova enyewo ayi ebe sara mbara, ayi gamu kwa ọmùmù n'ala nka.


Ka Chineke Nke puru ime ihe nile gọzie gi, me ka i mua, ọmùmù, Ya me kwa ka i ba uba, ka i we ghọ nkpọkọta nke ndi di iche iche:


Chineke we si ya, Mu onwem bu Chineke Nke puru ime ihe nile: gi mua ọmùmù ba kwa uba; mba na nkpọkọta mba gādi site na gi, ndi-eze gēsi kwa n'úkwù-gi puta;


Aha nke-abua ka ọ kpọrọ Efraim: si, N'ihi na Chineke emewom ka m'mua ọmùmù n'ala ewedaram ala.


Israel we biri n'ala Ijipt, n'ala Goshen; ha we nwe ihe-onwunwe nime ya, mu kwa ọmùmù, ba uba nke-uku.


Jekob we si Josef, Chineke Nke puru ime ihe nile mere ka m'hu Ya anya na Luz n'ala Kenean, Ọ gọziem,


sim, Le, M'nēme gi ka i mua ọmùmù, M'gēme kwa gi ka i ba uba, M'gēme kwa gi ka i ghọ nkpọkọta ndi di iche iche; M'gēnye kwa nkpuru-gi gānọchi gi ala nka, ka ọ buru ihe-onwunwe ebighi-ebi.


Ndi-eze di ike abuwo kwa ndi-isi Jerusalem, bú ndi nwere ike n'aru ndi nile nọ n'ofè osimiri; anēnye kwa ha utu-ala na utu-ahia na utu-uzọ.


M'gēche unu iru, me kwa ka unu mua ọmùmù, me kwa ka unu ba uba: M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosie ike n'ebe unu nọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan