Abraham we da kpue iru-ya n'ala, chì kwa ọchì, si n'obi-ya, Ọ̀ bu onye b͕ara ọgu arọ ise ka agā-muru nwa? Sera kwa, nke b͕ara ọgu arọ anọ na iri, ọ̀ gāmu nwa?
o welie anya-ya abua elu, hu, ma, le, ndikom atọ nēguzo onwe-ha na ncherita-iru ya: mb͕e ọ huru ha, o si n'ọnu-uzọ ulo-ikwū ahu b͕a ọsọ izute ha, ọ kpọ isi ala,
Ọ si kwa, Mu onwem bu Chineke nke nna-gi, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob. Moses we zobe iru-ya; n'ihi na ọ nātu egwu ilegide Chineke anya.
Dika eke-na-ogwurugwu si di n'ile ya anya, bú nke di n'igwe-oji n'ubọchi nke miri-ozuzo, otú a ka onwunwu-ọku ahu si di n'ile ya anya, bú nke di ya buruburu. Nka bu ka oyiyi nke ebube Jehova si di n'ile ya anya. M'we hu ya, da kpue irum n'ala, m'we nu olu nke otù Onye nēkwu okwu.
O rue, mb͕e ha nētib͕u, ma nání mu onwem fọduru, na adaram kpue irum n'ala, tie nkpu, si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! Ọ̀ bu onye-nbibi nke Israel nile ndi fọduru ka I gābu mb͕e I nāwukwasi Jerusalem ọnuma-Gi?
Ha we da kpue iru-ha n'ala, si, Chineke, bú Chineke nke mọ nile na anu-aru nile, bú madu, nwere, asi na otú nwoke emehie, Ì gēwesa kwa nzukọ a nile iwe?
Ọ si, É-è; kama mu onwem bu onye-isi usu-ndi-agha Jehova; ub͕u a ka m'biaworo. Joshua we da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala, si ya, Gini ka onye-nwem nāgwa orù-ya?
O rue, mb͕e ire-ọku nēsi n'ebe-ichu-àjà ahu rigo n'elu-igwe, na mọ-ozi nke Jehova rigoro nime ire-ọku nke ebe-ichu-àjà ahu: Manoa na nwunye-ya nēle kwa ya anya; ha we da kpue iru-ha n'ala.