Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 17:24 - Bible Nso

24 Abraham b͕ara ọgu arọ anọ na iri na iteghete, mb͕e ebiri ya úgwù n'anu-aru nke apí-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Ebraham gbara iri afọ itoolu na itoolu mgbe e biri ya ugwu,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 17:24
8 Iomraidhean Croise  

Abram we je, dika Jehova gwara ya okwu; Lot we so ya je: Abram b͕ara ọgu arọ atọ na iri na ise mb͕e o siri na Heran pua.


Mb͕e Abram b͕ara ọgu arọ anọ na iri na iteghete, Jehova mere ka Abram hu Ya anya, Ọ si ya, Mu onwem bu Chineke Nke puru ime ihe nile; gi jegharia n'irum, buru kwa onye zuru okè.


Agēbì unu úgwù n'anu-aru nke apí-unu; ọ gābu kwa ihe-iriba-ama nke ọb͕ub͕a-ndu di n'etiti Mu na unu.


Abraham we da kpue iru-ya n'ala, chì kwa ọchì, si n'obi-ya, Ọ̀ bu onye b͕ara ọgu arọ ise ka agā-muru nwa? Sera kwa, nke b͕ara ọgu arọ anọ na iri, ọ̀ gāmu nwa?


Ma Abraham na Sera ghọrọ agadi, ubọchi ndu-ha nāgwu; ọ ghawori idiri Sera dika ọ nādiri ndinyom.


Abraham b͕ara ọgu arọ ise, mb͕e amuru ya Aisak, bú nwa-ya nwoke.


ọ we nara ihe-iriba-ama nke bu obibì-úgwù, bú akàrà nke ezi omume nke okwukwe ahu nke di n'ebìghi-úgwù-ya: ka o we buru nna nke ndi nile kwere, ọ bu ezie na ha nọ n'ebìghi-úgwù, ka ewe gua ezi omume nye ha;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan