Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 17:23 - Bible Nso

23 Abraham we chiri Ishmael, bú nwa-ya nwoke, na ndi nile amuru n'ulo-ya, na ndi nile eji ego-ya b͕ata, nwoke nile ọ bula n'etiti ndikom ulo Abraham, o bìe ha úgwù n'anu-aru nke apí-ha n'otù ubọchi ahu, dika Chineke kpayere ya uka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Nʼụbọchị ahụ, Ebraham duuru Ishmel nwa ya nwoke, na ndị ikom niile a mụrụ nʼezinaụlọ ya, tinyere ndị e ji ego zụta, ndị ikom niile nọ nʼezinaụlọ ya, bie ha ugwu dịka Chineke gwara ya ka ọ mee.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 17:23
16 Iomraidhean Croise  

Mb͕e Abram nuru na adọtara nwa-nne-ya n'agha, ọ chiputa ndi-ya eziri ibu agha, bú ndi amuru n'ulo-ya, ọgu iri-na-ise na iri na asatọ, ọ we nāchu ha rue Dan.


Chineke we si Abraham, Gi onwe-gi kwa, i gēdebe ọb͕ub͕a-ndum, gi onwe-gi, na nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, rue ọb͕ọ-ha nile.


N'ihi na amawom ya, ka o we nye umu-ya na ulo-ya, ndi gānọchi ya, iwu, ka ha we debe uzọ Jehova, ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpe; ka Jehova we weta n'isi Abraham ihe O kwuru bayere ya.


Ndi nile ndi si n'ọnu-uzọ-ama obodo-ya nāpu we ge Hemoa, ge kwa Shekem nwa-ya, nti; ewe bìe nwoke ọ bula úgwù, ndi nile ndi si n'ọnu-uzọ-ama obodo-ya nāpu.


Abiaram ọsọsọ, ọ b͕agwojughkwam anya, Idebe ihe nile I nyere n'iwu.


Anyala isi bayere echi; N'ihi na i maghi ihe chi gābọ.


Ihe ọ bula aka-gi nāhu ime, were ike-gi me ya; n'ihi na ọ dighi ọlu, ma-ọbu ichè-èchìchè, ma-ọbu ihe-ọmuma, ma-ọbu amam-ihe, di n'ala-mọ, ebe gi onwe-gi nāla.


Nwoke a ka Pọl chọrọ ka o so ya pua; o we were ya bì ya úgwù n'ihi ndi-Ju ndi nọ n'ebe ahu: n'ihi na ha nile matara na nna-ya bu onye-Grik.


N'ihi na nime Kraist Jisus ọ dighi ike ọ bula obibì-úgwù ma-ọbu ebìghi-úgwù nwere; kama nke nwere ike bu okwukwe nke sitere n'aka ihu-n'anya alusi ọlu ike.


N'ihi na obibì-úgwù abughi ihe, ebìghi-úgwù abughi kwa ihe, kama ọ bu òkìkè ọhu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan