Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 16:15 - Bible Nso

15 Hega we muara Abram nwa-nwoke: Abram we kpọ aha nwa-ya nwoke, nke Hega muru, Ishmael.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Emesịa, Hega mụtaara Ebram nwa nwoke. Ebram kpọrọ nwa nwoke ahụ Hega mụtaara ya Ishmel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 16:15
13 Iomraidhean Croise  

Mọ-ozi nke Jehova si kwa ya, Le, gi onwe-gi di ime, i gaje imu nwa-nwoke; i gākpọ kwa aha-ya Ishmael, n'ihi na Jehova egewo nti na nweda-gi.


N'ihi nka ka akpọrọ ólùlù-miri ahu Bia-lahai-roi; le, ọ di n'etiti Kedesh na Bered.


Abram b͕ara ọgu arọ anọ na isi, mb͕e Hega muru Ishmael nye Abram.


Abraham we si Chineke, Biko, ka Ishmael di ndu n'iru Gi!


Ishmael kwa, anurum olu-gi bayere ya: le, agọziwom ya, M'gēme ka ọ mua ọmùmù, M'gēme kwa ka ọ ba uba nke-uku nke-uku; ndi-isi iri na abua ka ọ gāmu, M'gēme kwa ya ka ọ ghọ mba uku.


Ndia bu osuso-ọmumu Ishmael, nwa Abraham, onye Hega, bú nwayi Ijipt, bú nwayi nējere Sera ozi, muru nye Abraham:


Aisak na Ishmael, bú umu-ya, we lìe ya n'ọb͕à Makpila, n'ọhia Efron nwa Zoha onye Het, nke di n'iru Mamre;


Isọ we jekuru Ishmael lutara onwe-ya Mahalat na nwunye, bú nwa-nwayi Ishmael nwa Abraham, bú nwa-nne-nwayi Nebaiot, tiyere ndinyom ọ nwere.


Bianu, ka ayi re ya nye ndi Ishmael ndia, aka-ayi adi-kwa-la n'aru ya; n'ihi na nwa-nne-ayi, bú anu-aru-ayi, ka ọ bu. Umu-nne-ya we nu olu-ya.


Umu-ndikom Abraham; Aisak, na Ishmael.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan