Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 16:13 - Bible Nso

13 Ọ we kpọ aha Jehova Nke nāgwa ya okwu, Gi onwe-gi bu Chineke nāhu uzọ: n'ihi na ọ siri, Ọ̀ bu kwa n'ebe a ka m'leworo azu Onye nāhum anya?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Hega kpọkuru aha Onyenwe anyị, onye gwara ya okwu sị, “Ị bụ Chineke m na-ahụ m.” Nʼihi na Hega kwuru sị, “Ahụla m, ugbu a, onye ahụ na-ahụ m.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 16:13
14 Iomraidhean Croise  

Mọ-ozi nke Jehova we hu ya n'akuku isi-iyi miri ahu di n'ọzara, n'akuku isi-iyi ahu di n'uzọ Shua.


Abraham we kpọ aha ebe ahu Jehova-Jaire: dika anāsi rue taa, N'ugwu nke Jehova ka agāhu ya.


Ọ tua egwu, si, Le, otú ebe a di egwù nke-uku! nka abughi ihe ọzọ ma-ọbughi nání ulo Chineke, nka bu kwa ọnu-uzọ-ama elu-igwe.


Ọ buru na Chineke nke nnam, bú Chineke nke Abraham, na Oké Egwù nke Aisak, anọghi n'akukum, n'ezie ub͕u a n'aka efu ka i gēzilagawomri. Nweda-n'alam na ndọb͕u m'ji akam abua nādọb͕u onwem n'ọlu ka Chineke huworo, Ọ̀ we bara gi nba n'abali nyahuru.


Jekob we kpọ aha ebe ahu Peniel: n'ihi na ahuwom Chineke iru na iru, ka o kwuru, ewe naputa ndum.


Anyanwu we wa-kwasi ya mb͕e ọ gabigara Penuel, ya onwe-ya we nēje nsukwara-achi.


Ma Ọ setipughi aka-Ya megide ndi ahu arọputara n'etiti umu Israel: ha we hu Chineke anya, rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu.


N'ebe nile ọ bula ka anya abua nke Jehova di, Nēche ndi ọjọ na ndi bu ezi madu nche.


N'ihi na n'iru anya Jehova ka uzọ nile nke madu di, Okporo-uzọ-ya nile ka Ọ nēme ka ha di lari.


Gideon we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, kpọ ya Jehova-shalom: rue ta ọ digide n'Ọfra nke ndi Abieza.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan