Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 16:11 - Bible Nso

11 Mọ-ozi nke Jehova si kwa ya, Le, gi onwe-gi di ime, i gaje imu nwa-nwoke; i gākpọ kwa aha-ya Ishmael, n'ihi na Jehova egewo nti na nweda-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Mmụọ ozi Onyenwe anyị gwakwara ya sị, “Ị dị ime ugbu a, ị ga-amụ nwa nwoke. Aha ị ga-agụ ya bụ Ishmel nʼihi na Onyenwe anyị anụla maka nhụju anya gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 16:11
16 Iomraidhean Croise  

Chineke we si, Kama, Sera, bú nwunye-gi, gaje imuru gi nwa-nwoke; i gākpọ aha-ya Aisak: M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe ọ nọ, ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi nye nkpuru-ya gānọchi ya.


Chineke we nu olu nwa-okoro ahu; mọ-ozi nke Chineke we si n'elu-igwe kpọ Hega òkù, si ya, Gini nēme gi, Hega? atula egwu; n'ihi na Chineke anuwo olu nwa-okoro ahu n'ebe ọ nọ.


Ha we nọdu iri nri: ha we welie anya-ha, hu, ma, le usu-ije ndi Ishmael si na Gilead nābia, camel-ha nēbu kwa uda na balm na myrrh, nēje iweda ya n'Ijipt.


Ònye nēdoziri ugolo-ọma ihe-oriri-ya, Mb͕e umu-ya nētiku Chineke, Nāwaghari nēnweghi ihe-oriri?


N'ihi na O ledaghi nweda-n'ala nke onye ewedara n'ala anya, Ọ kpọghi kwa ya ihe-árú; O zonarighi kwa ya iru-Ya; Ma mb͕e o tikuru Ya, Ọ nuru olu-ya.


Jehova we si, Ahuwom n'ezie nweda-n'ala nke ndim nke di n'Ijipt, anuwokwam iti-nkpu-ha n'ihi ndi nāchi ha n'ihe-ike; n'ihi na amawom ihe-nb͕u-ha nile;


Ma ub͕u a, le, iti-nkpu umu Israel eruwom nti: ọzọ kwa, ahuwom nmeb͕u nke ndi Ijipt nēmeb͕u ha.


N'ihi nka Onye-nwe-ayi onwe-ya gēnye unu ihe-iriba-ama; le, nwa-ab͕ọghọ ahu di ime, ọ gaje kwa imu nwa-nwoke, ọ gākpọ kwa aha-ya Immanuel.


Ma mọ-ozi ahu siri ya, Atula egwu, Zakaraias: n'ihi na a nuwo aririọ-gi, nwunye-gi Elizabet gāmu-kwa-ra gi nwa-nwoke, i gākpọ kwa aha-ya Jọn.


Le kwa, i gāturu ime, muta Nwa-nwoke, kpọ aha-Ya Jisus.


O we riọ ha ka ha nye ya ihe eji ede akwukwọ, o we de, si, Aha-ya bu Jọn. O we ju ha nile anya.


O rue, n'ọb͕ub͕a arọ, na Hana turu ime, mua nwa-nwoke; o we kpọ aha-ya Samuel, si, N'ihi na ọ bu n'aka Jehova ka m'riọworo ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan