Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 15:5 - Bible Nso

5 O me ka ọ puta n'èzí, Ọ si, Biko, legide anya n'ebe elu-igwe di, gua kpakpando, ọ buru na i puru igu ha: Ọ si ya, Otú a ka nkpuru-gi gādi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kpọpụtara Ebram nʼezi sị ya, “Lelie anya gị elu na mbara eluigwe, gụọ kpakpando niile ị hụrụ ọnụ, ma ị ga-enwe ike ịgụta ha.” Ọ gwara ya sị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị. A gaghị agụta ha ọnụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 15:5
22 Iomraidhean Croise  

M'gēme kwa gi ka i ghọ mba uku, M'gāgọzi kwa gi, me ka aha-gi di uku; gi buru kwa ngọzi:


M'gēme kwa ka nkpuru-gi di ka ájá nke ala: ya bu na, ọ buru na madu puru iguta ájá nke ala, agāguta kwa nkpuru-gi.


Mọ-ozi nke Jehova si kwa ya, M'gēme ka nkpuru-gi ba uba nke-uku, agaghi-aguta kwa ya n'ihi ọtutu ọ di.


M'gētiye kwa ọb͕ub͕a-ndum n'etiti Mu na gi, me ka i ba uba nke-uku nke-uku.


na n'igọzi M'gāgọzi gi, n'ime ka aba uba M'gēme kwa ka nkpuru-gi ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, na dika ájá nke di n'usọ oké osimiri; nkpuru-gi gēnweta kwa ọnu-uzọ-ama nke ndiroya;


M'gēme kwa ka nkpuru-gi ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, M'gēnye kwa nkpuru-gi ala ndia nile; ọ bu kwa na nkpuru-gi ka mba nile nke uwa gāgọzi onwe-ha;


nkpuru-gi gādi kwa ka ájá ala, i gāb͕asa n'uzọ Ọdida anyanwu na n'uzọ Iru-anyanwu na n'uzọ Ugwu na n'uzọ Ndida: agāgọzi kwa ab͕uru nile nke elu-uwa nime gi na nime nkpuru-gi.


O we nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu abali ahu; o were kwa ufọdu nime ihe batara n'aka-ya ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma inye Isọ nwa-nne-ya;


Orù-Gi nọ kwa n'etiti ndi-Gi I rọputaworo, ndi bara uba, ndi anādighi-aguta ha, ndi anādighi-agu kwa ha ọnu, n'ihi iba-uba-ha.


Ma Devid agutaghi ọnu-ọgugu-ha site n'onye b͕ara orú arọ we rida: n'ihi na Jehova siri na Ọ gēme ka Israel ba uba dika kpakpando nke elu-igwe.


I me-kwa-ra ka umu-ha ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, I we me ka ha ba n'ala ahu nke I siri ndi bu nna-ha ka ha ba inweta ya.


Legide elu-igwe anya, hu; Kiri kwa mbara-ígwé nile nke di elu kari gi.


Ọ nāguta ọnu-ogugu kpakpando; Ha nile ka Ọ nākpọ aha.


Cheta Abraham, na Aisak, na Israel, bú ndi-orù-Gi, ndi I ji Onwe-gi ṅuru iyi, I we gwa ha okwu, si, M'gēme ka nkpuru-unu ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, ala nka nile kwa nke M'kwuworo okwu bayere ya, M'gēnye nkpuru-gi ya, ha gēketa kwa ya rue mb͕e ebighi-ebi.


Legidenu Abraham, bú nna-unu, legide kwa Sera nke muputara unu: n'ihi na -o bu mb͕e ọ bu nání otù onye ka M'kpọrọ ya, M'we gọzie ya, me ka ọ ba uba.


Otú agaghi-agu usu ihe di n'elu-igwe ọnu, na otú agaghi-atùta ájá nke oké osimiri; otú a ka M'gēme ka nkpuru Devid, bú orùm, na ndi Livai ndi nējerem ozi, ba uba.


Onye kwere mb͕e ọ gasiri oge olile-anya, ebe ọ dabere n'olile-anya, ka o we ghọ nna ọtutu mba, dika ihe ekwururi si di, Otú a ka nkpuru-gi gādi.


Jehova, bú Chineke-unu, emewo ka unu ba uba, ma, le, unu di ka kpakpando elu-igwe n'uba, ta.


Ọ bu ọgu madu atọ na iri ka nna-gi-hà ji rida n'Ijipt; ma ub͕u a Jehova, bú Chineke-gi, emewo gi ka i di ka kpakpando elu-igwe n'uba.


ọ bu kwa n'ihi nka ka esitere n'otù nwoke mu umu, mb͕e ọ di kwa ka onye nwuru anwu, bú umu bara uba dika kpakpando nke elu-igwe, di kwa ka ájá, nke di n'usọ oké osimiri, nke anāpughi iguta ọnu ya.


M'we si n'ofè Osimiri ahu kuru nna-unu, bú Abraham, me ka ọ nēje ije n'ala Kenean nile, M'we me ka nkpuru-ya ba uba, M'we nye ya Aisak.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan