Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 15:2 - Bible Nso

2 Abram we si, Onye-nwe-ayi, bú Jehova, gini ka I gēnyem, ebe mu onwem gaje ib͕a aka nwa si n'uwa la, ma onye gēnweta ulom bu Damesek Elieza?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ma Ebram zara sị ya, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gịnị bụ ihe ị ga-enye m ebe ọ bụ na m amụtaghị nwa? Lee, ọ bụ Elieza, onye Damaskọs, ga-eketa akụ m niile.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 15:2
21 Iomraidhean Croise  

Ọ we kesa onwe-ya imegide ha n'abali, ya onwe-ya na ndi-orù-ya, o tib͕ue ha, chua ha rue Hoba, nke di n'aka-ekpe Damaskọs.


Mb͕e ihe ndia gasiri, okwu Jehova ruru Abram nti n'ọhù, si, Atula egwu, Abram: Mu onwem bu ọta diri gi, ugwọ-ọlu-gi riri nne nke-uku.


Abram si kwa, Le, mu ka I nēnyeghi nkpuru: le kwa, nwa-ulom bu onye nēnweta ihem.


Orù ahu we chiri kamel iri, nime kamel nile nke onye-nwe-ya, je; ezi ihe nile nke onye-nwe-ya di kwa n'aka-ya: o bilie, je Mesọpọtemia, rue obodo Nehoa.


Abraham we si orù-ya, bú okenye nke ulo-ya, onye nāchi ihe nile o nwere, Biko, tiye aka-gi n'okpuru apata-ukwum:


Aisak we riọ Jehova aririọ n'ihi nwunye-ya, n'ihi na nwayi-àgà ka ọ bu: Jehova we kwe ka ọ riọta ihe ọ riọrọ, Rebeka, bú nwunye-ya, we turu ime.


ọ dighi uku n'ulo a kari mu onwem; o b͕ochighi kwa ihe ọ bula n'ebe m'nọ ma-ọbughi nání gi, n'ihi na gi onwe-gi bu nwunye-ya: m'gēsi kwa aṅa me oké ihe ọjọ nka, mehie megide Chineke?


Ha we biakute nwoke ahu nso, nke bu onye-isi ulo Josef, ha gwa ya okwu n'ọnu-uzọ ulo ahu,


Ọ we nye onye bu onye-isi ulo-ya iwu, si, Kpojue akpa ndikom ahu n'ihe-oriri, otú ha puru ibu, tinye kwa ego onye ọ bula n'ọnu akpa-ya.


Le, ihe-nketa nke nēsi n'aka Jehova bia ka umu bu: Ugwọ-ọlu Ọ nākwu ka nkpuru nke afọ bu.


Nchere anēchere ogologo mb͕e di anya nēme ka obi nāria ọria: Ma osisi nke nēnye ndu ka ihe anāchọsi ike bu, mb͕e ọ biaruworo.


Orù nke nwere uche gāchi nwa madu nēweta ihere, Ọ bu kwa n'etiti umu-nne nwa ahu ka ọ gēkere ihe-nketa.


Ibu eboro Damaskọs. Le, ewezugawo Damaskọs n'ibu obodo, o we ghọ obo-ihe dara ada.


M'gēnye, ha n'ulom na nime mb͕idim nile ihe-ncheta na aha di nma kari umu-ndikom, kari kwa umu-ndinyom; aha ebighi-ebi ka M'gēnye ha n'otù n'otù, nke anāgaghi-ebipu.


Nke diri Damaskọs. Ihere emewo Hemat na Apad; n'ihi na akukọ ọjọ ka ha nuworo, ha ab͕azewo: n'oké osimiri ka ncheb͕u di; ọ pughi inọ jū.


ma O nyeghi ya ala-nketa nime ya, é-è, Ọ nyeghi ya ebe izọkwasi ukwu-ya: O we kwe nkwa na O gēwere ya nye ya, na nkpuru-ya soro ya n'azu, ka ọ buru ihe ha nwere, mb͕e ọ kādighi nwa ọ muru.


Nwa-okorọbia ahu nke edoro onye-isi ndi n=eb#i ọka we za, si, Nwa-ab͕ọghọ Moab ka ọ bu, nke soro Naomi si n>ala-ọhia Moab lata:


Ọ we kwe nkwa, si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ buru na I lekwasi anya n'ezie na nweda-n'ala nke orù-Gi nwayi, ọ buru na I chetam, ghara ichezọ orù-Gi nwayi, we nye orù-Gi nwayi nwa-nwoke, m'gēnye kwa ya Jehova ubọchi ndu-ya nile, aguba agaghi-aga kwa n'elu isi-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan