Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 15:15 - Bible Nso

15 Ma gi onwe-gi gālakuru nna-gi-hà n'udo; agēlì gi n'ezi isi-awọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ma ị ga-anwụ nʼudo. A ga-eli gị mgbe ị kara ezi nka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 15:15
29 Iomraidhean Croise  

Emesia Abraham lìri Sera, bú nwunye-ya, n'ọb͕à ọhia Makpila ahu n'iru Mamre (nke ahu bu Hebron), n'ala Kenean.


Ọbìa na onye-nnọdu ka m'bu n'etiti unu: nyenum ihe-onwunwe, bú ala-ílì, n'etiti unu, ka m'we lìpu ya n'anyam, bú onye-nkem nwuru anwu.


Aisak we kubie ume, nwua, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ, ọ bu agadi, ubọchi-ya jukwara ya afọ: Isọ na Jekob, bú umu-ya ndikom, we lìe ya.


kama mu na nnam-hà gēdina, i gēsi kwa n'Ijipt bupum, lìkwam n'ílì-ha. Ọ si, Mu onwem gēme dika okwu-gi si di.


Ọ we nye ha iwu, si ha, Anāchikọta mu onwem na ndi nkem n'ala-mọ: lìenum n'ebe nnam-hà di n'ọb͕à nke di n'ọhia nke Efron, bú onye Het,


n'ebe ahu ka ha lìri Abraham na Sera nwunye-ya; n'ebe ahu ka ha lìri Aisak na Rebeka nwunye-ya; ọ bu kwa n'ebe ahu ka m'liri Lia:


umu-ya ndikom we bubata ya n'ala Kenean, lìe ya n'ọb͕a nke ọhia Makpila, nke Abraham zutara, ya na ọhia, ka ọ buru ihe-onwunwe nke gābu ala-ílì, n'aka Efron onye-Het, n'iru Mamre.


Ma Devid ghọrọ agadi, ubọchi ndu-ya ju-kwa-ra ya afọ, o we me Solomon, bú nwa-ya, eze Israel.


O we nwua n'ezi isi-awọ, ubọchi nile nke ndu-ya na àkù na nsọpuru ju-kwa-ra ya afọ: Solomon nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.


Le, M'gāchikọta gi na nna-gi-hà n'ala-mọ, agāchikọta kwa gi na ndi ọzọ je n'ílì-gi n'udo, anya-gi agaghi-ele kwa ihe ọjọ a nile nke Mu onwem nēme ka ọ biakwasi ebe a, biakwasi kwa ndi bi nime ya. Ha we weghachiri eze okwu.


Ọ nēme uzọ ka ọ nēnwuso ya; Madu gēchè na ob͕u-miri nwere isi-awọ.


Job we nwua, buru agadi, ubọchi ndu-ya ju-kwa-ra ya afọ.


I gābia n'ílì n'ezib͕o agadi, Dika obo ọka si ala elu na mb͕e-ya.


Riba onye zuru okè ama, le kwa onye ziri ezi: N'ihi na ọdi-n'iru diri onye-udo.


Ọ gābakuru ọb͕ọ nna-ya-hà; Rue mb͕e ebighi-ebi ha agaghi-ahu ìhè.


ájá ewe laghachi n'ala dika o si diri, mọ alaghachikuru kwa Chineke Onye nyere ya.


Ọ buru na nwoke amuta ọgu umu ise, di kwa ndu ọtutu arọ, ubọchi nke arọ-ya ewe ba uba, ma afọ adighi-eju nkpuru-obi-ya n'ezi ihe, ọzọ kwa, ọ dighi olìlì diri ya; asiwom, na nwa amukworo amukwo di nma kari ya:


Ma gi onwe-gi, la, rue ọgwugwu ihe ndia: i gēzu kwa ike, guzo ọtọ n'ebe ekeworo nye gi, n'ọgwugwu ubọchi ndia.


Agāchikọta Eron na umu-nna-ya n'ala-mọ' n'ihi na ọ gaghi-abà n'ala ahu nke M'nyeworo umu Israel, n'ihi na unu nupuru isi n'okwu-ọnum na miri Meriba.


Ma mb͕e i huworo ya, agāchikọta kwa gi na umu-nna-gi n'ala-mọ, ọbuná gi onwe-gi, dika achikọtara Eron, bú nwa-nne-gi na umu-nna-ya:


Mu onwem bu Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob? Chineke abughi Chineke nke ndi nwuru anwu, kama Ọ bu nke ndi di ndu.


N'ihi na Devid, mb͕e o jesiri ọb͕ọ-ya ozi, o sitere n'ìzù Chineke da n'ura ọnwu, ewe tọb͕ọ ya n'ebe nna-ya-hà nọ, o we hu ire-uré:


Jehova we si Moses, Le, gi na nna-gi-hà ganēdina; ndi nka gēbili kwa, soro chi ala ọzọ nile nke ala ahu kwa iko, bú ebe ha onwe-ha nābà n'etiti ya, ha gārapukwam, mebi kwa ọb͕ub͕a-ndum nke Mu nà ha b͕ara.


Ewe chikọta kwa ọb͕ọ ahu nile na ndi bu nna-ha n'ala-mọ: ọb͕ọ ọzọ we bilie inọchi ha, ndi nāmaghi Jehova, ha amaghi kwa omume nke O mere Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan