si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ugo uku nke nkù-ya abua di uku, ábúbà-ya di kwa ogologo, nke juputara n'uruma, nke turu agwa, biaruru Lebanon, were ọnu-ọnu cedar:
Ugo uku ọzọ di kwa, nke nkù-ya abua di uku, uruma-ya di kwa ọtutu: ma, le, osisi vine a rubere nkpọrọgwu-ya nile n'ebe ọ nọ, ọ bu kwa alaka-ya nile ka ọ wara n'ebe ọ nọ site na nkpuru nile nke ebe akuru ya, ka o we b͕a ya miri.