Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 14:13 - Bible Nso

13 Onye b͕apuru ab͕apu we bia gosi Abram, bú onye-Hibru: ma ya onwe-ya bi n'etiti osisi terebinth nke Mamre, bú onye-Amorait, nwa-nne Eshkol, na nwa-nne Ana; ndi ahu bu kwa ndi ha na Abram di n'ọb͕ub͕a-ndu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Ma otu onye gbara ọsọ ndụ site nʼebe ahụ gara kọọrọ Ebram onye Hibru ihe mere. Nʼoge a, Ebram bi nʼebe dị nso nʼosisi ukwu nke Mamre, onye Amọrị, nwanne Eshkọl na Anea, ndị ha na Ebram gbara ndụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 14:13
23 Iomraidhean Croise  

na ndi Jebus, na ndi-Amorait, na ndi-Giagashait;


Abram we ropu ulo-ikwū-ya, bia biri n'etiti osisi terebinth nke Mamre, nke di nime Hebron, o wuere Jehova ebe-ichu-aja n'ebe ahu.


Ka ihe ọ bula ghara idirim: nání ihe nke umu-okorọbia ndia riri, na òkè nke ndikom ahu mu na ha yikọrọ je: Ana, na Eshkol, na Mamre, ka ha onwe-ha were òkè-ha.


Jehova we me ka ọ hu Ya anya n'etiti osisi terebinth nke Mamre, mb͕e ya onwe-ya nānọdu n'ọnu-uzọ ulo-ikwū-ya n'ikpo-ọku nke ehihie;


Abraham we si, Mu onwem gāṅu iyi.


Abraham we chiri ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi nye Abimelek; ha abua we b͕a ndu.


Ha we b͕a ndu na Bia-sheba: Abimelek we bilie, ya na Faikol, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya, ha laghachi n'ala ndi Filistia.


na ọ kpọrọ ndikom ulo-ya, gwa ha okwu, si, Lenu, o mewo ka nwoke. Hibru bakute ayi ikwa ayi emò; ọ bakuterem idina-yerem, m'we kpọ nkpu n'oké olu:


n'ihi na ezupurum n'ala ndi-Hibru n'ezie: ọzọ kwa, n'ebe a emeghm ihe ọ bula ka ha we tinye m n'olùlù a.


Ma ayi na otù okorọbia nọ n'ebe ahu, bú onye-Hibru, orù onye-isi nke ndi-ob͕ū nwere; ayi we kọrọ ya, ọ we kọrọ ayi isi nrọ-ayi; onye ọ bula n'etiti ayi dika nrọ-ya si di ka ọ kọrọ isi nrọ nye.


Ha we dọkwasiri ya nke ya iche, dọkwasikwara ha nke ha iche, dọkwasi-kwa-ra ndi Ijipt nke ha iche, bú ndi ya na ha nērikọ ihe: n'ihi na ndi Ijipt apughi isoro ndi-Hibru rie nri; n'ihi na ihe-árú ka nke ahu buru ndi Ijipt.


ndi Sheba we dakwasi ha, chiri ha; ọzọ kwa, ha ewerewo ọnu mma-agha tib͕ue ndi nējere gi ozi; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi.


O rue na mb͕e ahu, mb͕e Moses toputaworo, na ọ pukuru umu-nne-ya, ihu ihe ngbu ha anya: o we hu nwoke Ijipt ka o nētib͕u nwoke Hibru, otù nime umu-nne-ya.


O we meghe ya, hu nwa ahu, ma, le, ọ bu nwata-nwoke nākwa ákwá. O we nwe ọmiko n'aru ya, si, Otù nime umu ndi-Hibru ka nka bu.


Ha gēge kwa nti n'olu-gi: i gābiakute kwa eze Ijipt, gi onwe-gi na ndi-okenye Israel, unu gāsi kwa ya, Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, ezutewo ayi: ub͕u a kwa, biko, ka ayi je ije nke ubọchi atọ n'ọzara, ka ayi we chuara Jehova, bú Chineke-ayi, àjà.


na ha nile gēzilaga, onye ọ bula orù-ya nwoke, na onye ọ bula nwanyi nējere ya ozi, nke bu nwoke Hibru ma-ọbu nwanyi Hibru, inwere onwe-ya; ka madu we ghara ime ka ha fè ya òfùfè-orù, onye ọ bula o me ka onye-Ju, bú nwa-nne-ya, fè ya:


O we si ha, Onye-Hibru ka m'bu; ọ bu kwa Jehova, bú Chineke nke elu-igwe, ka m'nātu egwu Ya, bú Onye mere oké osimiri na ala-akọrọ.


Ha we biarue ndagwurugwu Eshkol, si n'ebe ahu b͕utu otù alaka na otù uyọkọ nkpuru-vine; ha we būru ya n'osisi eji ebu ihe n'etiti madu abua; ha weta-kwa-ra ufọdu nime nkpuru pomegranate na ufọdu nime nkpuru fig.


Israel we ziga ndi-ozi jekuru Saihon, bú eze ndi-Amorait, si,


Hà bu ndi-Hibru? mu onwem bu kwa. Hà bu ndi Israel? mu onwem bu kwa. Hà bu nkpuru Abraham? mu onwem bu kwa.


Nwenu uche a nime onwe-unu, nke di kwa nime Kraist Jisus:


Ndi-isi Filistia we si, Ndi-Hibru ndia, hà bu gini? Ekish we si ndi-isi ndi Filistia, Nkà abughi Devid, bú orù Sọl eze Israel, onye mu na ya nọworo ubọchi ndia ma-ọbu arọ ndia, ma ahutaghm n'aru ya ihe ọ bula di njọ site n'ubọchi ọ dapuru n'aka Sọl rue ta?


Otù nwoke onye Benjamin we si n'usoro agha ahu b͕a ọsọ, biarue Shailo n'ubọchi ahu, uwe nwuda ya nile dọwara adọwa, ájá dikwasi ya n'isi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan