Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 14:10 - Bible Nso

10 Ma ndagwurugwu Sidim bu nání olùlù olùlù nke bitumen; ndi-eze Sọdọm na Gọmọra we b͕alaga, da n'ebe ahu, ndi fọduru we b͕alaga n'ugwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ma Ndagwurugwu Sidim jupụtara nʼolulu apịtị. Mgbe ndị agha eze Sọdọm na Gọmọra bidoro ịgba ọsọ. Ụfọdụ nʼime ha dabanyere nʼime olulu ndị a, ma ndị fọdụrụ gbapụrụ ọsọ gbaga nʼugwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 14:10
12 Iomraidhean Croise  

Ha we sirita ibe-ha, Ngwa, ka ayi kpua brick, kpọ ha ọku nke-ọma. Ha we nwe "brick'' n'ọnọdu nkume, ọ bu kwa bitumen ka ha nwere n'ọnọdu urọ.


Ha we chiri àkù nile nke Sọdọm na Gọmọra, na ihe-oriri-ha nile, la.


Eze Sọdọm we pua izute ya, mb͕e o siri na ntib͕u nke Kedoalaoma na ndi-eze ahu, bú ndi ya na ha yikọrọ, latasia, rue ndagwurugwu Shave (nke ahu bu Ndagwurugwu Eze).


Eze Sọdọm we si Abram, Nyem nání nke bu madu, ma were àkù n'onwe-gi.


Ndia nile jikọtara onwe-ha n'otù na ndagwurugwu Sidim (nke ahu bu Oké Osimiri Nnú).


imegide Kedoalaoma, bú eze Ilam, na Taidal, bú eze Goyim, na Amrafel, bú eze Shaina, na Ariok, bú eze Elasa; eze anọ megide eze ise ahu.


O rue, mb͕e ha mesiri ka ha puta n'azu obodo, na ọ siri, Wepuga onwe-gi n'ihi ndu-gi; elekwala anya n'azu gi, eguzokwala na Gburugburu-ala a nile; wepuga onwe-gi je ugwu ahu, ka ewe ghara ikpochapu gi.


Lot we si na Zoa rigo, biri n'ugwu ahu, ya na umu-ya ndinyom abua; n'ihi na ọ turu egwu ibi nime Zoa: ọ we biri n'ọb͕à, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom abua.


Ekpochapuru ha n'En-doa; Ha ghọro ǹsí eji mezi ala.


Ọ gēru kwa, na onye ahu nke nāb͕anari olu oké egwu ahu gādabà n'olùlù ahu; ọzọ, onye ahu nke nārigoputa n'etiti olùlù ahu, agējide ya n'ib͕udu ahu: n'ihi na window nile nke di n'elu ka emegheworo, ntọ-ala nile nke uwa ewe me nkpatu.


Onye ahu nke nāb͕apu n'iru oké egwu ahu gādabà n'olùlù ahu; ọzọ, onye ahu nke nārigoputa n'òlùlù ahu, agējide ya n'ib͕udu ahu: n'ihi na M'gēme ka arọ nleta-ha biakute ya, bú Moab; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


O rue, mb͕e Israel b͕usiri ndi nile bi na Ai n'ọhia, bú n'ọzara ebe ha churu ha, mb͕e ha nile dasiri n'ọnu mma-agha, rue mb͕e ha gwusiri, na Israel nile laghachiri na Ai, ọnu mma-agha tib͕ue ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan