Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 13:14 - Bible Nso

14 Ma Jehova siri Abram, mb͕e Lot kewapusiri onwe-ya n'ebe ọ nọ, Biko, welie anya-gi abua, si n'ọnọdu a, ebe gi onwe-gi nọ, le anya n'Ugwu na na Ndida na n'Iru-anyanwu na n'Ọdida-anyanwu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Mgbe Lọt siri nʼebe ahụ pụọ, Onyenwe anyị gwara Ebram okwu sị ya, “Site nʼebe ahụ ị nọ lelie anya gị, lee anya nʼugwu na ndịda, nʼọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 13:14
6 Iomraidhean Croise  

Lot we welie anya-ya abua, hu Gburugburu-ala nile nke Jọdan, na ala ahu nile bu ala miri nēdè nke-ọma, tupu Jehova ebibie Sọdọm na Gọmọra, dika ubi Jehova ab͕ara ogige, dika ala Ijipt, mb͕e i nēje Zoa.


nkpuru-gi gādi kwa ka ájá ala, i gāb͕asa n'uzọ Ọdida anyanwu na n'uzọ Iru-anyanwu na n'uzọ Ugwu na n'uzọ Ndida: agāgọzi kwa ab͕uru nile nke elu-uwa nime gi na nime nkpuru-gi.


Welie anya-gi abua le buruburu, we hu: ndia nile achikọtawo onwe-ha, biakute gi. Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta,) n'ezie ha nile ka i gēyiri dika ihe-ichọ-nma, were ha ke, dika nwunye ọhu.


Welie anya-gi abua le buruburu, hu: ha nile achikọtawo onwe-ha, ha abiakutewo gi: umu-gi ndikom gēsi n'ebe di anya bia, agēku kwa umu-gi ndinyom n'akuku-gi.


Rigo n'elu Pisga, welie anya-gi abua le akuku Ọdida-anyanwu, na akuku Ugwu na akuku Ndida, na akuku ọwuwa-anyanwu, were kwa anya-gi abua le: n'ihi na i gaghi-agabiga Jọdan nka.


Moses we si n'ala ihe nādighi nke Moab rigorue ugwu Nebo, rue elu Pisga, nke di n'iru Jeriko. Jehova we me ka ọ hu ala ahu nile; Gilead, rue Dan;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan