Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 13:10 - Bible Nso

10 Lot we welie anya-ya abua, hu Gburugburu-ala nile nke Jọdan, na ala ahu nile bu ala miri nēdè nke-ọma, tupu Jehova ebibie Sọdọm na Gọmọra, dika ubi Jehova ab͕ara ogige, dika ala Ijipt, mb͕e i nēje Zoa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Lọt lelitere anya hụ na mbara ala Jọdan bụ ala mmiri na-ezokwasị nke ọma, ala dịka ubi a gbara ogige Onyenwe anyị, dịka ala ndị Ijipt nke dị na nso nso Zoa. (Ihe a mere tupu Onyenwe anyị ebibie obodo Sọdọm na Gọmọra.)

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 13:10
26 Iomraidhean Croise  

Ma ndia bu osuso-ọmumu Tira. Tira muru Abram na Nehoa na Heran; Heran muru Lot.


Lot we rọputara onwe-ya Gburugburu-ala nile nke Jọdan; Lot we bulie ije je n'Iru-anyanwu: ha we kewapu onwe-ha otù n'aru nwa-nne-ya.


Ala nka nile, ọ̀ dighi n'iru gi? biko, kewapu onwe-gi n'arum: ọ buru aka-ekpe, m'gēje kwa n'aka-nri: ma ọ buru aka-nri, m'gēje kwa n'aka-ekpe.


na ha buru agha megide Bira, bú eze Sọdọm, megide kwa Biasha, bú eze Gọmọra, na Shainab, bú eze Adma, na Shemiba, bú eze Zeboyim, na eze Bila (nke ahu bu Zoa).


Eze Sọdọm na eze Gọmọra na eze Adma na eze Zeboyim na eze Bila (nke ahu bu Zoa) we pua, do agha n'usoro imegide ha nime ndagwurugwu Sidim;


Nwayi we hu na osisi ahu di nma ihe-oriri, na ọ bu kwa ihe nāgu anya agu ile, na ihe anāchọsi ike ka osisi ahu bu kwa ime ka madu nwe uche, o were ufọdu nime nkpuru-ya, rie; o nye kwa di-ya, tinyere onwe-ya, o we rie.


ala Ijipt, n'iru gi ka ọ di; me ka nna-gi na umu-nne-gi biri n'ebe kachasi nma nke ala nka; ha gēbiri n'ala Goshen: ọ buru kwa na i mara, si, na ndi-dìnkpà dí n'etiti ha, i gēdo kwa ha ndi-isi anu-ulo m'nwere.


na umu-ndikom nke Chineke huru umu-ndinyom nke madu na ha mara nma; ha we lutara onwe-ha ndinyom site na ndi nile ha rọputara.


Na buruburu-ala Jọdan ka eze wuru ha, n'ala urọ n'etiti Sukot na Zaretan.


Le, osimiri nērùsi ike, ọ dighi-ama jijiji: Ọ nātukwasi obi, mb͕e Jọdan nāwaputa rue ọnu-ya.


Ala nke nāmi nkpuru ka ọ ghọ ala nnú nnú, Site n'ihe ọjọ nke ndi bi nime ya nēme.


Obim nētiri Moab nkpu; ndi-ọ̀sọ́-ya, nāb͕a ọsọ rue Zoa, rue Eglat-shelishiya: n'ihi na nrigo Luhit, o ji ikwa-ákwá arigo na ya; n'ihi na n'uzọ Horonaim ka ha nētisi nkpu ntikpọ ike.


N'ihi na Jehova akasiwo Zaion obi: Ọ kasiwo nkpọnkpọ ebe-ya nile, me ka ọzara-ya di ka Iden, me ka ala-ya nke ihe nādighi di ka ubi Jehova ab͕ara ogige; obi-utọ na ọṅù ka agāhu nime ya, na ekele, na olu abù ọma.


Site n'iti-nkpu Heshbon rue Eleale, rue Jehez ka ha mere ka olu-ha da, site na Zoa rue Horonaim, rue Eglat-shelishiya: n'ihi na ọbuná miri Nimrim gāghọ nání ebe tọb͕ọrọ n'efu.


Nwa-nne-gi nwanyi nke-okenye bu Sameria, nke bi n'aka-ekpe-gi, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom: nwa-nne-gi nwanyi nke-ntà, nke bi n'aka-nri-gi, bu Sọdọm na umu-ya ndinyom.


Le, nka bu ajọ omume nke Sọdọm, bú nwa-nne-gi nwanyi; npako, na afọ ojuju nri, na udo nke inọ-jū, diri ya na umu-ya ndinyom; ma o meghi ka aka nke onye ewedara n'ala na ob͕eye di ike.


N'Iden, bú ubi Chineke ab͕ara ogige, ka i nọworo; nkume nile ọ bula nke di oké ọnu-ahia bu ihe-nkpuchi-gi: bú sardius, na topaz, na diamond, na beryl, na onyx, na jasper, na sapphire, na esmerald, na carbuncle, na ọla-edo: ije-ozi nke egwú-otiti-gi nile na ọ̀jà-gi nile di nime gi; n'ubọchi ekère gi, mb͕e ahu ka edoziri ha.


Osisi cedar nile nke di n'ubi Chineke ab͕ara ogige ezoghi ya: osisi fir nile eyighi ngalaba-ya nile, osisi plane nile adighi kwa ka alaka-ya nile; ọ dighi kwa osisi ọ bula nke di n'ubi Chineke ab͕ara ogige nke yiri ya n'ima-nma-ya.


Ihe nke mara nma ka M'mere ya ka ọ ghọ n'iba-uba nke alaka-ya: osisi nile nke Iden, nke di n'ubi Chineke nke ab͕ara ogige, we kwoso ya ekworo.


Ma akuku Iru-anyanwu, site n'etiti Hauran na Damaskọs na Gilead, na ala Israel, gābu Jọdan; site n'ókè-ala Ugwu rue oké osimiri nke Iru-anyanwu ka unu gātù. Nka bu kwa akuku Iru-anyanwu.


N'iru ha ka ọku nēripia ihe; ọ bu kwa n'azu ha ka ire-ọku nēsuye ọku esuye: dika ubi ahu ab͕ara ogige, bú Iden, ka ala di n'iru ha, n'azu ha ọ bu ọzara tọb͕ọrọ n'efu; e, ọ dighi kwa ihe ọ bula b͕apuworo n'aka-ha.


na Negeb, na Buruburu-ala nke ndagwurugwu Jeriko, bú obodo nkwu, rue Zoa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan