Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 12:16 - Bible Nso

16 Ọ we me Abram nke-ọma n'ihi ya: ọ we nwe ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na oke-inyinya-ibu, na ndi-orù ndikom, na ndinyom nēje ozi, na nne-inyinya-ibu, na kamel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Fero mesoro Ebram mmeso ọma nʼihi nwunye ya. Ebram nwetara igwe atụrụ, na ehi, na nne ịnyịnya ibu, oke na nwunye, na ndị ohu ndị nwoke na ndị nwanyị, na ịnyịnya kamel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 12:16
13 Iomraidhean Croise  

Abram bu kwa ọgaranya nke-uku n'anu-ulo na n'ọla-ọcha, na n'ọla-edo.


Ala ahu anagideghi ha, ibikọ n'otù: n'ihi na àkù-ha riri nne, ha apughi kwa ibikọ n'otù.


Ma Serai, bú nwunye Abram, amughi nwa nye ya: ma ọ nwere otù nwayi nējere ya ozi, bú onye Ijipt, onye aha-ya bu Hega.


Abimelek we chiri ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, na orù-ndikom na ndinyom nēje ozi, nye Abraham, me kwa ka Sera nwunye-ya laghachikute ya.


Jehova agọziwo kwa onye-nwem nke-uku; o we di uku: O nyewo kwa ya ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, na ọla-ọcha na ọla-edo, na orù-ndikom na ndinyom nēje ozi, na camel na inyinya-ibu di ọtutu.


ọ we nwe ihe-nnweta, bú ìgwè ewu na aturu, na ihe-nnweta, bú igwè ehi, na ọtutu ndi-orù: ndi Filistia we nēkwo ya ekworo.


Nwoke ahu we basa nke-uku nke-uku, ọ we nwe ìgwè ewu na aturu ri nne, na ndinyom nēje ozi, na orù-ndikom, na camel na inyinya-ibu di ọtutu.


enwekwara m ehi, na inyinya-ibu, na ìgwè ewu na aturu, na orù-ndikom, na ndinyom nēje ozi: m'we zìe igosi onye-nwem, ihuta amara n'iru gi.


Ihe-nnweta-ya di nnù ewu na aturu iri-na-asa na ọgu iri, na nnù camel asa na ọgu iri, na nnù ehi abua na ọgu iri ejikọrọ abua abua, na nnù nne-inyinya-ibu na ọgu ise, na ndi-orù bara uba nke-uku; nwoke ahu we di uku kari umu Iru-anyanwu nile.


Ọzọ, Jehova gọziri ikpe-zu Job kari nmalite-ya, o we nwe orú nnù ewu na aturu na nnù iri-na-ise, na nnù camel iri-na-ise, na nnù ehi ise ejikọrọ abua abua, na nnù nne-inyinya-ibu abua na ọgu iri.


Ma ọ buru na orù ahu gāsi n'obi-ya, Onye-nwem nānọ ọdù di anya ibia; ọ buru kwa na ọ gāmalite iti ndikom na ndinyom nēje ozi aka, na iri ihe-oriri na iṅu ihe-ọṅuṅu, na iṅubiga manya ókè;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan