Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 10:9 - Bible Nso

9 Ya onwe-ya bu dike n'ichu-ntá n'iru Jehova: n'ihi nka ka anāsi, Dika Nimrod, bú dike n'ichu-ntá n'iru Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ọ bụ dike nʼịchụ nta, nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ nke a mere e ji na-ekwu okwu na-asị, “Ị dị ka Nimrọd, dike nʼịchụ nta, nʼihu Onyenwe anyị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 10:9
13 Iomraidhean Croise  

Nmalite ala-eze-ya bu Bebel, na Erek, na Akad, na Kalne, n'ala Shaina.


Kush muru Nimrod; onye ahu malitere ibu dike n'uwa.


Ma ndi Sọdọm bu ndi ọjọ na ndi-nmehie megide Jehova nke-uku.


Umu-okoro ahu we tó etó: Isọ we buru nwoke mara ichu ntá, onye ọhia; ma Jekob bu nwoke zuru okè, nēbi n'ulo-ikwū.


O rue, mb͕e Aisak gọzisiri Jekob, mb͕e Jekob nọ kwa nāpù n'iru Aisak nna-ya ub͕u a, na Isọ nwa-nne-ya siri n'ichu-ntá-ya bata.


Ma ebibiri uwa n'iru Chineke, uwa juputakwara n'ihe-ike.


Nefilim nọ n'uwa na mb͕e ahu, ha nọ kwa ma emesia, mb͕e umu-ndikom nke Chineke nābakuru umu-ndinyom nke madu, mb͕e ha nāmukwara ha umu: ndi ahu bu ndi-dike ahu ndi nọri site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ndi amara aha-ha.


Ma na mb͕e nkpab͕u ahu akpab͕uru ya, o mekpuru emekpu kari imegide Jehova, bú eze Ehaz nka.


Le, nwoke nke nādighi-eme Chineke ebe-ya siri ike; Kama ọ tukwasiri obi n'uba nke àkù-ya, Ọ di ike n'ọchichọ ọjọ ya.


nke nēziga ndi-ukọ̀ n'oké osimiri, ọbuná n'ub͕ọ papyrus di iche iche n'elu miri! Unu ndi-ozi nkọ, jekurunu otù mba ndi di ogologo di kwa lari n'aru, rue otù ndi di egwu site na nmalite-ya ga n'iru; bú mba nātùta atùta nāzọda kwa azọda, nke osimiri di iche iche kewaworo ala-ya!


Le, M'gaje iziga kpọ ọtutu ndi-ọ́kù, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ha gākùru ha; emesia M'gēziga kpọ ọtutu ndi-ntá, gēsi n'elu ugwu ọ bula, na n'elu ugwu ntà ọ bula, na nime nb͕awa nkume nile di elu, chu ntá ha.


si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ahuhu diri ndinyom ndi nādukọta ohiri-isi n'elu nkwonkwo-aka nile, ndi nēme kwa ákwà-nb͕okwasi nye isi onye ọ bula ka ogologo-ya ra ichu ntá nkpuru-obi madu! ọ̀ bu nkpuru-obi nile nke ndim ka unu gāchu ntá, me kwa ka nkpuru-obi unu nwere di ndu?


Onye-ebere alawo n'iyì pua n'uwa, ọ dighi kwa onye ziri ezi n'etiti madu: ha nile nēche anwu ọbara; ha ji ub͕u achu ntá, onye ọ bula nwa-nne-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan