Pul, bú eze Asiria, we bia imegide ala ahu; Menahem we nye Pul nnù talent ọla-ọcha abua na ọgu iri, ka aka-ya we diyere ya ime ka ala-eze di ike n'aka-ya.
Mb͕e onye a nọ nēkwu, onye ọzọ bia-kwa-ra, si, Ndi Kaldea doro usu atọ, made imegide camel, chiri ha, ọzọ kwa, ha were ọnu mma-agha tib͕ue ndi nējere gi ozi; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi.
Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na Onye-nwe-ayi gēseti kwa aka-Ya ọzọ nke ub͕ò abua inweta ndi-Ya fọduru, bú ndi gāfọdu, site n'Asiria, site kwa n'Ijipt, site kwa na Patros, site kwa na Kush, site kwa n'Ilam, site kwa na Shaina, site kwa na Hemat, site kwa n'agwe-etiti nile nke oké osimiri.
Ọhù siri ike ka egosiworom; onye-nghọb͕u nāghọb͕u, onye nāpunara madu ihe nāpunara madu ihe. Rigo, gi Ilam; nọchigide n'agha, gi Midia; ize-ume-ya nile ka M'meworo ka ọ kwusi.
M'gēdo kwa ihe-iriba-ama n'etiti ha, si kwa n'etiti ha ziga ndi b͕aputara ab͕aputa ka ha jekuru mba nile, bú Tashish, na Pul, na Lud, ndi nādọ uta, jekuru Tubal na Jevan, jekuru agwe-etiti nile di anya, ndi nānughi ihe bayerem, ndi nāhughi kwa ebubem: ha gēgosi ebubem n'etiti mba nile.
N'ebe ahu ka Ilam na ìgwè ndi-ya nile ndi nọ ílì-ya buruburu di: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha, ndi ridara n'ebighi-úgwù rue ala di n'okpuru uwa, bú ndi mere ka ujọ-ha di n'ala ndi di ndu, we būru ihere-ha, ha na ndi nārida n'olùlù.
M'we hu n'ọhù ahu; o we rue, mb͕e m'nāhu, na mu onwem nọ na Shushan, bú ulo uku eze nke di n'Ilam, bú ala anāchi achi; m'we hu n'ọhù ahu, ma le, mu onwem nọ n'akuku osimiri Ulai.