m'gēme kwa gi ka i were Jehova, bú Chineke nke elu-igwe na Chineke nke uwa, ṅu iyi, na i gaghi-alutara nwam nwunye sitere n'umu-ndinyom nke ndi Kenean, ndi mu onwem bi n'etiti ha:
M'we ridata inaputa ha n'aka ndi Ijipt, na ime ka ha si n'ala ahu rigorue ala di nma nke sa-kwa-ra mbara, rue ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya; rue ebe nke ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus.
Debere onwe-gi ihe nke Mu onwem nēnye gi n'iwu ta: le, M'gaje ichupu ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, n'iru gi.
Ka ihere me gi, Zaidon: n'ihi na oké osimiri ekwuwo, bú ebe siri ike nke oké osimiri, si, Ime emeghm, amuputakwaghm nwa, emekwaghm ka umu-okorọbia toputa, emekwaghm ka umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke tozue okè.
n'ihi ubọchi ahu nke nābia ipunara ndi Filistia nile ihe-ha, ibipu na Taia na ibipu na Zaidon onye-iye-aka ọ bula nke fọduru: n'ihi na Jehova nāpunara ndi Filistia ihe, bú ndi agwe-etiti Kaftoa fọduru.
Jehova we nye ha n'aka Israel, ha we tib͕ue ha, chu kwa ha rue Zaidon bara uba, ru kwa Misrefot-maim, ru kwa ndagwurugwu Mizpe n'akuku Ọwuwa-anyanwu; ha tib͕ue ha, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ha rapuru ha.
Devid we za, si Ahimelek, bú onye Het, si kwa Abishai nwa Zeruaia, bú nwa-nne Joab, si, Ònye gēsorom ridakuru Sọl, rue ọmuma-ulo-ikwū? Abishai we si, Mu onwem gēsoro gi rida.