13 Mizraim muru Ludim, na Anamim, na Lehabim, na Naftuhim,
13 Ijipt bụ nna ndị Lud, ndị Anam, ndị Lehab, ndị Naftuh,
na Resen n'etiti Nineve na Kala (nke ahu bu obodo uku ahu).
Umu-ndikom Ham kwa; Kush, na Mizraim, na Put, na Kenean.
Rigonu, unu inyinya; kpọtuanu nkpọtu, unu ub͕ọ-ala; ka ndi-dike puta kwa: Kush na Put, ndi nēji ọta; na Ludim, ndi nēji nāzọ kwa uta ukwu ikwe ya.
Etiopia, na Put, na Lud, na ndi nile gwara ọgwa, na Kub, na umu nke ala nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, gēso ha da site na mma-agha.