Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 1:9 - Bible Nso

9 Chineke we si, Miri ahu nke di n'okpuru elu-igwe, ka achikọta ha n'otù ebe, ka ahú kwa ala-akọrọ: ọ we di otú a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Chineke kwuru sị, “Ka mmiri dị nʼokpuru mbara eluigwe chịkọta onwe ha ọnụ nʼotu ebe, ka ala akọrọ pụta.” O sikwa otu a dịrị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 1:9
17 Iomraidhean Croise  

Chineke we kpọ mbara ahu Elu-igwe. Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-abua.


Gi onwe-gi bu Jehova, nání Gi; Gi onwe-gi emewo elu-igwe, bú elu-igwe nke elu-igwe nile, na usu-ha nile, na uwa na ihe nile nke di n'elu ya, na oké osimiri nile na ihe nile nke di nime ha, Gi onwe-gi nēdebe kwa ha nile ndu; usu ihe elu-igwe nākpọ kwa isi ala nye Gi.


Ọ kpawo ókè buruburu n'elu miri, Rue nsọtu ìhè na ọchichiri.


Ọ nēseti Ugwu n'elu ebe tọb͕ọrọ n'efu, O nēkokwasi kwa uwa n'ihe nābughi ihe.


Onye nēdo ihe-njikọta nke ime-ulo-elu-Ya nile nime miri: Onye nēme igwe-oji ka ha buru ub͕ọ-ala-Ya; Onye nējeghari n'elu nkù abua nke ifufe:


Ọ nāchikọta miri oké osimiri dika obo-ihe: Ọ nētiye ob͕u-miri n'ulo-àkù di iche iche.


Onye nwere oké osimiri, Ya onwe-ya me-kwa-ra ya; Ọ bu kwa aka-Ya kpuru ala-akọro.


Osimiri nile nērùdaru oké osimiri, ma oké osimiri ejughi eju, rue ebe osimiri nērùda, rue ebe ahu ka osimiri ahu nērùghachi ọzọ.


ọ̀ bu Mu ka unu nādighi-atu egwum? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: ọ̀ gaghi-eb͕u unu nb͕u n'ihi irum? Mu onye doworo ájá ibu ókè nke oké osimiri, site n'ukpuru ebighi-ebi, ọ gaghi-agabiga kwa ya, ọ bu ezie na nmali-miri-ya nile nāmaghari, ma ha apughi; ọ bu ezie na ha nēbib͕o, ma ha adighi-agabiga ya.


O we si ha, Onye-Hibru ka m'bu; ọ bu kwa Jehova, bú Chineke nke elu-igwe, ka m'nātu egwu Ya, bú Onye mere oké osimiri na ala-akọrọ.


N'ihi na nka mere ha nchefu n'ihi na ha nāchọ ya, na elu-igwe di site na mb͕e ochie, ha na ala nke esitere na miri were kwa miri me ka o guzokọ n'otù, site n'okwu Chineke;


we were Onye ahu Nke nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, bú Onye kère elu-igwe na ihe nile di ya nime, na uwa na ihe nile di ya nime, na oké osimiri na ihe nile di ya nime, ṅu iyi na oge agaghi-adi kwa ọzọ:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan