Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 1:3 - Bible Nso

3 Chineke we si, Ka ihè di: ìhè we di.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Mgbe ahụ Chineke kwuru sị, “Ka ìhè dị,” ìhè dịkwara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 1:3
22 Iomraidhean Croise  

Ndia bu usoro okike elu-igwe na uwa mb͕e ekere ha, n'ubọchi ahu mb͕e Jehova, bú Chineke, mere uwa na elu-igwe.


Le, Ọ b͕asawo ìhè-Ya n'elu ya; Ebe dikarisiri omimi nke oké osimiri ka O kpuchiwo-kwa-ra.


Òle ebe ọ di, bú uzọ ebe-obibi ìhè? Ọchichiri kwa, òle ebe ọ di, bú ọnọdu-ya;


Gi Onye nēji ìhè kpuchi Onwe-gi dika uwe-nb͕okwasi; Onye nēseti elu-igwe dika ákwà-nkwuba:


Chineke ka Jehova bu, Ọ nyewo kwa ayi ìhè: Chiri udọ̀ ke àjà-ememe, durue ya na mpi nile nke ebe-ichu-àjà.


Ka ha to aha Jehova: N'ihi na Ya onwe-ya nyere iwu, ewe kè ha.


Okwu Jehova ka ejiri me elu-igwe; Eji-kwa-ra iku-ume nke ọnu-Ya me usu-ha nile.


N'ihi na Ya onwe-ya kwuru okwu, o we di; Ya onwe-ya nyere iwu, o we guzo.


Aghaworo onye ezi omume ìhè dika nkpuru, Aghawo-kwa-ra ndi ziri ezi n'obi ọṅù.


Abum Onye nākpu ìhè na Onye nēkè ọchichiri; abum Onye nēme udo na Onye nēkè ihe ọjọ: Mu onwem bu Jehova, Onye nēme ihe ndia nile.


Anyanwu agaghi-abū-kwa-ra gi ìhè ọzọ n'ehihie; ma n'onwu-maramara ọnwa agaghi-enye gi ìhè: ma Jehova gāghọrọ gi ìhè ebighi-ebi, Chineke-gi gāghọ-kwa-ra gi ima-nma-gi.


O we setipu aka-Ya, metu ya, si, Anamachọ; ka eme ka i di ọcha. Ngwa ngwa ewe me ka ọ di ọcha n'ekpenta-ya.


Ìhè ahu we nāmu n'ọchichiri; ọchichiri ahu ejideghi kwa ya.


Ezi Ìhè ahu diri, Nke nēnye madu ọ bula nke nābia nime uwa ìhè.


Ma mb͕e O kwusiri ihe ndia, O were oké olu tie nkpu, si, Lazarọs, puta n'èzí.


Ma nka bu ikpé ahu, na Ìhè ahu abiawo n'uwa, ma madu huru ọchichiri n'anya kama Ìhè ahu; n'ihi na ọlu-ha jọrọ njọ.


N'ihi na ọ bu Chineke, Onye siri, Ìhè gēsi nime ọchichiri nwuputa, bu Onye nwubàra nime obi-ayi, iweta inye-ìhè nke ọmuma nke ebube nke Chineke n'iru nke Jisus Kraist.


N'ihi nka Ọ si, Teta, gi onye nāraru ura, Si kwa na ndi nwuru anwu bilie, Kraist ahu gāmukwasi kwa gi.


n'ihi na unu buri ọchichiri n'oge gara aga, ma unu bu ìhè ub͕u a nime Onye-nwe-ayi: nējegharinu dika umu nke ìhè


Onye nání Ya nwere anwughi-anwu, nēbi nime ìhè nke anāpughi ibiaru nso; Onye ọ dighi madu ọ bula huworo Ya anya, ma-ọbu pu ihu Ya anya: Onye nsọpuru na ike ebighi-ebi diri. Amen.


Nka bu kwa ozi ahu nke ayi nuworo n'ọnu-Ya, nākọ-kwa-ra unu, na Chineke bu ìhè, ọ dighi kwa ọchichiri ọ bula di nime Ya.


Ọzọ, ihe ọhu enyere n'iwu ka m'nēdegara unu, ya bu ihe nke bu ezi-okwu nime Ya na nime unu; n'ihi na ọchichiri ahu nāgabiga, ezi ìhè ahu nāmu kwa ub͕u a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan