Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jenesis 1:28 - Bible Nso

28 Chineke we gọzie ha: Chineke we si ha, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa uwa, buda ya n'okpuru onwe-unu; nwekwanu ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu nile ọ bula di ndu nke nākpu akpu n'elu uwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Chineke gọziri ha sị ha, “Mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ nʼụwa, meenụ ka ihe niile dịrị nʼokpuru unu. Chịanụ azụ niile nke osimiri na anụ ufe niile nke eluigwe na ihe niile e kere dị ndụ nke na-akpụgharị akpụgharị nʼala.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jenesis 1:28
28 Iomraidhean Croise  

Chineke we gọzie ha, si, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa miri di n'oké osimiri nile, ka anu-ufe ba kwa uba n'uwa.


M'gāgọzi ya, ọzọ kwa, M'gēnye gi nwa-nwoke site na ya: M'gāgọzi kwa ya, ọ gāghọ kwa mba di iche iche; ndi-eze nke ndi di iche iche gēsite na ya di.


Ishmael kwa, anurum olu-gi bayere ya: le, agọziwom ya, M'gēme ka ọ mua ọmùmù, M'gēme kwa ka ọ ba uba nke-uku nke-uku; ndi-isi iri na abua ka ọ gāmu, M'gēme kwa ya ka ọ ghọ mba uku.


Ha we gọzie Rebeka, si ya, Nwa-nne-ayi, gi onwe-gi ghọ nnù kwuru nnù madu, ọzọ, ka nkpuru-gi nweta ọnu-uzọ-ama nke ndi nākpọ ha asì.


Jehova we me ka ọ hu Ya anya n'abali ahu, si, Mu onwem bu Chineke nke Abraham nna-gi: atula egwu, n'ihi na Mu na gi nọ, M'gāgọzi kwa gi, me ka nkpuru-gi ba uba n'ihi Abraham, bú orùm.


Ọ welie anya-ya abua, hu ndinyom na umu-ha; ọ si, Òle ndi bu ndia gi na ha yikọro? Ọ si, Umu nke Chineke nyeworo orù-gi n'amara.


Site na Chineke nke nna-gi; Ya yere gi aka! Na Onye Nke puru ime ihe nile; Ya gọzie gi! Ngọzi nile nke elu-igwe site n'elu, Ngọzi nile nke ob͕u-miri nke nāma-kpu n'okpuru, Ngọzi nile nke ara na nke àkpà-nwa.


nwoke na nwayi ka O kere ha; Ọ gọzie ha, kpọ aha-ha Madu, n'ubọchi ekere ha.


O rue, mb͕e madu malitere iba uba n'elu ala, mb͕e amukwara umu-ndinyóm nye ha,


Anu nile ọ bula nke di ndu nke gi na ya nọ, bú nke sitere n'anu-aru nile, nime anu-ufe, na nime anu-ulo, na nime ihe nile nākpu akpu nke nākpu akpu n'uwa, gi me ka ha so gi puta; ka ha we nuputa n'uwa, mua ọmùmù, ba uba n'elu uwa.


Chineke we gọzie Noa na umu-ya ndikom, si ha, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa uwa.


Unu onwe-unu kwa, muanu ọmùmù, banu uba; nuputanu umu n'uwa, ba uba nime ya.


na Amiel, bú nke-isi, na Isaka, bú nke-asa, na Peuletai, bú nke-asatọ: n'ihi na Chineke gọziri ya.


Jebez we kpọkue Chineke Israel, si, Ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na I gọziem n'ezie, me kwa ka ókè-alam rie nne, ọ buru kwa na aka-Gi gādiyerem, I we me ka m'pua n'ihe ọjọ, ka ọ ghara iwutam! Chineke we me ka ihe nke ọ riọrọ biarue ya aru.


Ì gātukwasi ya obi n'ihi na ike-ya riri nne? Ma-ọbu ì gārapuru ya ndọb͕u i nādọb͕u onwe-gi n'ọlu?


Ọzọ, Jehova gọziri ikpe-zu Job kari nmalite-ya, o we nwe orú nnù ewu na aturu na nnù iri-na-ise, na nnù camel iri-na-ise, na nnù ehi ise ejikọrọ abua abua, na nnù nne-inyinya-ibu abua na ọgu iri.


Ọ nāgọzi kwa ha, ha we ba uba nke-uku; Ọ dighi-eme kwa ka anu-ulo-ha bilata.


Elu-igwe bu elu-igwe Jehova nwere; Ma uwa ka O nyeworo umu madu.


Ka elu-igwe na ala to Ya, Ha na oké osimiri, na ihe ọ bula nke nākpughari nime ha.


I nēme ya ka ọ nāchi ọlu nile nke aka-Gi abua; Ihe nile ka I doro n'okpuru ukwu-ya abua:


Ewu na aturu na ehi, ha nile, Ha na anu ọhia;


N'ihi na otú a ka Jehova Nke kèworo elu-igwe siri; Ya onwe-ya bu Chineke: Onye kpuworo uwa, me ya; Ya onwe-ya mere ka o guzosie ike, ọ bughi ihe tọb͕ọrọ n'efu ka Ọ kère ya, ọ bu ka ewe biri nime ya ka Ọ kpuru ya: Mu onwem bu Jehova; ọ dighi kwa Chineke ọzọ di.


M'gēche unu iru, me kwa ka unu mua ọmùmù, me kwa ka unu ba uba: M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosie ike n'ebe unu nọ.


ndi nēb͕ochi madu ilu di na nwunye, ndi si kwa madu erila ihe-oriri di iche iche, nke Chineke kère ka ndi kwere ekwe, ndi mazu-kwa-ra ezi-okwu, ka ndi ahu were ekele nara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan