Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jemis 5:7 - Bible Nso

7 Ya mere, umu-nnam, nātachinu ogologo-ntachi-obi rue ọbibia nke Onye-nwe-ayi. Le, onye-ọlu-ubi nēche nkpuru di oké ọnu-ahia nke ala, nātachi ogologo-ntachi-obi n'ebe ọ di, rue mb͕e ọ gānata miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Nweenụ ntachiobi, ụmụnna m, cherenụ ọbịbịa Onyenwe anyị. Lee otu onye ọrụ ubi si eji ndidi na-eche mkpụrụ ọ kụrụ nʼala ubi ka ọ mịa. O ji ndidi na-eche ka mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ zokwasị ubi ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jemis 5:7
32 Iomraidhean Croise  

Ha asighi kwa n'obi-ha, Biko, ka ayi tua egwu Jehova, bú Chineke-ayi, Onye nēnye oké miri-ozuzo, ma nke-mbu ma nke-ikpe-azu, na mb͕e-ya; ízù nile akara àkà nke owuwe-ihe-ubi ka Ọ nēdebere ayi.


Ka ayi mara kwa, ka ayi b͕aso imara Jehova; dika chi-ọbubọ, otú a ka ọpupu-Ya guzosiworo ike: Ọ gābiakute kwa ayi dika oké miri-ozuzo, dika miri-ozuzo ikpe-azu nke nēzosa ala.


Umu Zaion, teghari-kwa-nu egwú ọṅù, ṅuri kwa na Jehova, bú Chineke-unu: n'ihi na Ọ nēnye unu miri-ozuzo mbu ka ezi omume-Ya si di, me kwa ka oké miri-ozuzo zodatara unu, bú miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu, n'ọnwa mbu.


Riọnu Jehova miri-ozuzo n'oge miri-ozuzo nke-ikpe-azu, ọbuná Jehova Nke nēme àmùmà; ọ bu kwa oké miri-ozuzo ka Ọ gēnye ha, nye onye ọ bula ihe-ọkukù n'ubi-ya.


N'ihi na Nwa nke madu gaje ibia n'ebube nke Nna-Ya, Ya na ndi-mọ-ozi-Ya; mb͕e ahu ka Ọ gēnyeghachi kwa onye ọ bula dika omume-ya si di.


N'ezie asim unu, Ufọdu di n'etiti ndi guzoro n'ebe a, ndi nāgaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli rue mb͕e ha gāhu Nwa nke madu ka Ọ nābia n'ala-eze-Ya.


N'ihi na dika àmùmà si n'Ọwuwa-anyanwu puta, gosi kwa onwe-ya rue Ọdida-anyanwu; otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi.


N'ihi nka unu onwe-unu buru kwa ndi edoziworo: n'ihi na n'oge hour nke unu nēchèghi ka Nwa nke madu gābia.


Asim unu, na Ọ gēkpeputa ha ọsọsọ. Otú ọ di, mb͕e Nwa nke madu gābia, Ọ̀ gāhu okwukwe n'elu uwa?


Mb͕e ahu ha gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nābia n'igwe-oji, Ya na ike na oké ebube.


Nkpuru nke di n'ala ọma ahu, ndia bu ndi were ezi obi di nma jisie okwu ahu ike, mb͕e ha nuru ya, ha were kwa ntachi-obi mia nkpuru.


Jisus si ya, Ọ buru na anamachọ ka ọ nọgide rue mb͕e M'gābia, ọ̀ bu gini n'ebe i nọ? gi onwe-gi som.


Ya mere okwu a putara n'etiti umu-nna nime Kraist, na onye ahu nke nēso uzọ-Ya agaghi-anwu: ma Jisus asighi ya, na ọ gaghi-anwu; kama, Ọ buru na anamachọ ka ọ nọgide rue mb͕e M'gābia, ọ̀ bu gini n'ebe i nọ?


N'ihi na ka ha ra, bú ihe edere n'akwukwọ nsọ n'oge gara aga, edere ha izí ayi ihe, ka ayi we were ntachi-obi na nkasi-obi nke ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ nwe olile-anya.


ndi site na ntachi-obi n'ezi ọlu nāchọ otuto na nsọpuru na apughi-imebi ka Ọ gēnye ndu ebighi-ebi:


nke mere na ọ dighi onyinye-amara fọduru nke unu nēnweghi; unu nēche kwa nkpughe Onye-nwe-ayi Jisus Kraist;


N'ihi na ayi onwe-ayi ji Mọ Nsọ nēchesi ihe anēle anya ike, bú ezi omume, site n'okwukwe.


Ma ike agwula ayi n'obi n'ime ihe ọma: n'ihi na ayi gēweta ihe-ubi mb͕e oge-ya ruru, ma ayi adaghi #mbà.


na m'gēnye miri-ozuzo ala-unu na mb͕e-ya, miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu, ka i we chikọta ọka-gi, na manya-vine ọhu gi, na manu-gi.


ebe anēme ka unu di ike nime ike nile, dika ike nke ebube-Ya si di, rue ntachi-obi na ogologo-ntachi-obi nile, ya na ọṅù;


ebe ayi nēcheta nēwepughi aka ọlu nke okwukwe unu na ndọb͕u-n'ọlu nke ihunanya unu na ntachi-obi nke olile-anya unu ji ele anya Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi;


N'ihi na gini bu olile-anya-ayi, ma-ọbu ọṅù-ayi, ma-ọbu okpu-eze nke inya-isi ayi? Ọ̀ bughi kwa unu onwe-unu, n'iru Onye-nwe-ayi Jisus n'ọbibia-Ya?


ka O we me ka obi-unu guzosie ike nādighi ita uta n'idi-nsọ n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi, n'ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus, Ya na ndi nsọ Ya nile.


Otú a o we nwe ogologo-ntachi-obi, we nata kwa nkwa ahu.


Umu-nnam, unu ekwutọritala ibe-unu. Onye nēkwutọ nwa-nna-ya, ma-ọbu nēkpe nwa-nna-ya ikpé, o nēkwutọ iwu, nēkpe kwa iwu ikpé: ma ọ buru na i nēkpe iwu ikpé, i bughi onye nēdebe iwu, kama i bu onye-ikpé-ya.


Umu-nnam, natanu ndi-amuma ahu, bú ndi kwuru okwu n'aha Onye-nwe-ayi, dika ihe-ilere-anya nke ihuju-anya na nke ogologo-ntachi-obi.


Ọla-edo-unu na ọla-ọcha-unu ab͕awo nchara; nchara-ha gāburu kwa unu ihe-àmà, ọ gēripia kwa anu-aru-unu dika ọku. Unu kpadoro àkù-unu na mb͕e ikpe-azu.


nāsi kwa, Òle ebe nkwa nke ọbibia-Ya di? n'ihi na site n'ubọchi nna-ayi-hà dara n'ura ọnwu, ihe nile nādigide dika ha diworo site na nmalite nke òkìkè.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan