Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jemis 5:4 - Bible Nso

4 Le, ugwọ-ọlu nke ndi-ọlu ndi bìri ọka n'ubi-unu, nke unu jidere na nmeb͕u, nēti nkpu: iti-nkpu nke ndi ahu ndi were ihe-ubi-unu abàwo na nti Onye-nwe usu nile nke ndi-agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Geenụ ntị! Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu jụrụ ịkwụ ụgwọ ọrụ ha dị ka o kwesiri na-agbago imegide unu. Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu ghọgburu, eruola ntị Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jemis 5:4
23 Iomraidhean Croise  

Ọ si, Gini ka i meworo? ge nti! olu ọbara nwa-nne-gi nētikum site n'ala.


Ime ka iti-nkpu nke onye nēnweghi ike biarue Ya ruo, Iti-nkpu nke ndi ewedara n'ala ka Ọ nānu kwa.


Dika orù si ekusie ume ike ibà n'okpuru ǹdò, Na dika onye egoro ọlu si ele anya ugwọ-olu-ya:


N'ihi na Onye nājuta ọbara ndi eb͕uru eb͕u echetawo ha: O chezọghi iti-nkpu nke ndi ewedara n'ala.


n'ihi na nke ahu bu ihe-nb͕okwasi o nwere nání ya, nke ahu bu uwe-nb͕okwasi-ya iyikwasi n'akpukpọ-aru-ya: ọ̀ bu nime gini ka o gēdina? o gēru kwa, mb͕e ọ nētikum, na M'gānu; n'ihi na onye-amara ka M'bu.


Ma ub͕u a, le, iti-nkpu umu Israel eruwom nti: ọzọ kwa, ahuwom nmeb͕u nke ndi Ijipt nēmeb͕u ha.


Ọ buru na Jehova nke usu nile nke ndi-agha emeghi madu ole-na-ole nke fọduru ka ha fọduru ayi, ayi gādiwori ka Sọdọm, ayi gēyiwori Gọmọra.


N'ihi na ubi-vine nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu ulo Israel, ndi Juda bu kwa ihe-ọkukú nātọ Ya utọ nke-uku: O we le anya ikpe ziri ezi, ma, le, nwusi-ọbara; O lere anya ezi omume, ma, le, iti-nkpu.


Na ntim abua ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, N'ezie ọtutu ulo gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọbuná ulo uku nke bu kwa ezi ulo, nke ọ nādighi onye ọ bula nēbi nime ha.


Ahuhu gādiri onye ji ajọ omume ewu ulo-ya, nke ji kwa ikpé nēzighi ezi ewu ime-elu-ya nile; nke nēme ka madu-ibe-ya fè òfùfè n'efu, ọ dighi-enye kwa ya ugwọ-ọlu-ya;


Emeb͕ula madu-ibe-gi, anapu-kwa-la ya ihe n'ike: ugwọ-ọlu nke onye egoro ọlu agaghi-adigide n'aka-gi ogologo abali nile rue ututu.


N'ihi na nkume gēsi na mb͕idi tie nkpu, ntuhie gēsi kwa n'osisi di n'ulo za ya.


M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Mb͕e ahu Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, Owuwe-ihe-ubi riri nne n'ezie, ma ndi-ọlu di ole-na-ole.


Ma Chineke, Ọ̀ gaghi-ekpeputa ndi nke Ya arọputara, ndi nākpọku Ya ehihie na abali, O nwe-kwa-ra ogologo ntachi-obi n'ebe ha nọ?


Ọzọ, dika Aisaia buru uzọ kwue, Ọ buru na Onye-nwe usu nile nke ndi-agha arapughi ayi otù nkpuru, Ayi gādiwori ka Sọdọm, agēmewori ayi ka ayi yie Gọmọra.


Lezie onwe-gi anya ka okwu nke jọb͕uru onwe-ya ghara idi n'obi-gi, si, Arọ nke-asa, bú arọ nrapu, di nso; anya-gi we jọ njọ n'aru nwa-nne-gi, bú ob͕eye, i we ghara inye ya ihe; o we kpọkue Jehova megide gi, o we buru nmehie nime gi.


Ndi-nwe madu, nēnye-kwa-nu ndi-orù-unu ihe ziri ezi na nke ra nrata; ebe unu matara na unu onwe-unu nwe-kwa-ra otù Onye Nke bu Onye-nwe-unu n'elu-igwe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan