Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jemis 5:19 - Bible Nso

19 Umu-nnam, asi na onye ọ bula n'etiti unu si n'ezi-okwu jehie, ma otù onye we me ka o chigharia;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Ụmụnna m, ọ bụrụ na onye ọbụla nʼetiti unu esite nʼeziokwu ahụ jehie, ma otu onye nʼime unu akpọghachi ya azụ,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jemis 5:19
21 Iomraidhean Croise  

I ledawo ndi nile si n'ukpuru nile Gi jehie anya, N'ihi na okwu-ugha ka aghughọ-ha bu.


I basiworo ndi-nganga ndi abuworo ọnu nba ike, Ndi nēsi n'ihe nile I nyere n'iwu jehie.


Nwam, rapu inu idọ-aka-na-nti Nke nēme ka i si n'okwu-ọnu nile nke ihe-ọmuma waghari.


Ndim, ndi nāchi ha n'ihe-ike bu nwatakiri, ndinyom achiwo kwa ha. Gi ndim, ndi-nduzi-gi nēme ka i wagharia, ha elodawo kwa uzọ nke okporo-uzọ-gi nile.


Nke furu efu ka M'gāchọ, ọ bu kwa nke achufuru achufu ka M'gēwelata, ọkpukpu ab͕ajiri ab͕aji ka M'gēkezi kwa, nke aru-ya nādighi ike ka M'gēme kwa ka ọ di ike: ma nke mara abuba na nke di ike ka M'gēkpochapu; M'gāzù ha n'ikpé ziri ezi.


Unu emeghi ka ndi aru-ha nādighi ike di ike, unu agwọghi kwa nke nāria ọria, unu ekezighi kwa ọkpukpu b͕ajiri ab͕aji, unu eweghachighi kwa nke achufuru achufu, unu achọghi kwa nke furu efu; kama n'ike na nkpab͕u ka unu zọdaworo ha.


Ọzọ, ọ buru na nwa-nna-gi emehie megide gi, je, tua ya nmehie-ya n'anya n'etiti nání gi na ya abua: ọ buru na ọ nuru olu-gi, i ritara nwa-nna-gi n'urù.


ma Mu onwem riọrọ aririọ bayere gi, ka okwukwe-gi ghara igwu agwu: gi-onwe-gi, mb͕e i gēchighariwori, gi me kwa ka umu-nna-gi guzosie ike.


Umu-nnam, asi na ọ bu ezie na anwude madu mb͕e ọ nọ na ndahie ọ bula, unu onwe-unu, bú ndi Mọ Nsọ nāchi, menu ka madu di otú a guzozie nime mọ nke idi-nwayọ; nēlezi onwe-gi anya, ka aghara inwa kwa gi onwe-gi.


N'ihi na ihu ego n'anya bu nkpọrọgwu nke ihe ọjọ nile di iche iche: nke ufọdu nāb͕asosi ike, ewe duhie ha n'okwukwe-ayi, ha were kwa ọtutu ihe-nb͕u dupue onwe-ha.


bú ihe-ọmuma nke ufọdu kwuputara we hie n'ihe bayere okwukwe-ayi. Ka amara diyere unu.


bú madu ndi hiere n'ihe bayere ezi-okwu ahu, nāsi na nbilite-n'ọnwu agabigawo ub͕u a, ha nēkpù kwa okwukwe madu ufọdu iru.


ọ bu kwa onye puru iwere nwayọ nēmeso ndi nāmaghi ihe ndi nējehie kwa ejehie, n'ihi na adighi-ike di kwa ya onwe-ya gburugburu;


Unu ekwela ka eduhie unu, umu-nnam ndi m'huru n'anya.


Unu matara nka, umu-nnam ndi m'huru n'anya. Ma ka madu ọ bula buru onye nānu ihe ọsọsọ, onye nādighi ngwa ikwu okwu, nādighi kwa ngwa iwe iwe:


Ma ọ buru na unu nwere ekworo di ilu na ikpa-iche-iche n'obi-unu, unu anyala isi, unu ekwu-kwa-la okwu-ugha megide ezi-okwu.


ka ọ mara na onye meworo ka onye-nmehie si na njehie nke uzọ-ya chigharia gazọputa nkpuru-obi n'ọnwu, o gēkpuchi kwa ọtutu nmehie.


Ya mere, unu onwe-unu, ndi m'huru n'anya, ebe unu buru uzọ mara ihe ndia, nēchenu onwe-unu nche, ka aghara iwere njehie nke ndi nēmebi iwu bupu unu, unu we si na nguzosi-ike nke aka unu dapu.


Ahuhu gādiri ha, n'ihi na ha gara n'uzọ Ken, wusì kwa onwe-ha dika miri na njehie nke Belam n'ihi ugwọ-ọlu, we la n'iyì na nkwugide nke Kora.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan