Jemis 5:11 - Bible Nso11 Le, ayi nākpọ ha ndi ngọzi diri, bú ndi tachiri obi: unu nuru ihe bayere ntachi-obi nke Job, hu kwa ihe Onye-nwe-ayi zubere, na Onye-nwe-ayi bu onye nwere ọmiko ri nne, nwe kwa obi ebere. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a11 Anyị na-agụ ha ugbu a dịka ndị a gọziri agọzi nʼihi iguzosike ha. Unu anụla maka ogologo ntachiobi nke Job nwere, unu ahụkwala nzube Onyenwe anyị nʼihi na Onyenwe anyị jupụtara nʼebere na ọmịiko. Faic an caibideil |
ha we ju inu ihe, ha echetaghi kwa oké ọlu-Gi nile nke I luru n'etiti ha; ha we kwesie olu-ha ike, do onye-isi nime nnupu-isi-ha ilaghachi n'ọbubu-orù-ha: ma Gi onwe-gi bu Chineke nke nb͕aghara nmehie, Onye nēme amara nwe kwa obi-ebere, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Onye nāba uba n'ebere, I rapughi kwa ha.
O we kpere Jehova, si, Biko, Jehova, Ǹka abughi okwum, mb͕e m'nānọ n'alam? N'ihi nka ka m'buru uzọ b͕alaga na Tashish: n'ihi na amaram na Gi onwe-gi bu Chineke nke bu onye-amara, onye-obi-ebere, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ Nke nāba kwa uba n'ebere, Nke nēchèghari kwa uche bayere ihe ọjọ ahu I gēweta.