Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jemis 5:1 - Bible Nso

1 Genu nti, unu ndi-ọgaranya, kwa ákwá, ti-kwa-nu nkpu n'ihi ihuju-anya nile unu nke nābiakwasi unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ugbu a geenụ ntị unu ndị ọgaranya, oge eruola mgbe unu kwesiri ịkwa akwa na ịsụ ude nʼihi nsogbu na-akwado ịbịakwasị unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jemis 5:1
36 Iomraidhean Croise  

N'aka madu site n'aka-Gi, Jehova, N'aka madu nke uwa, ndi òkè-ha bu na ndu a, Ndi I nēmeju afọ-ha n'ihe-Gi atukọbara atukọba: Afọ nēju ha n'umu, Ha we rapuru umu-ntakiri-ha ihe-ha fọduru.


Onye nātukwasi obi n'àkù-ya, onye ahu gāda: Ma dika akwukwọ ndu ka ndi ezi omume gēpú.


Àkù adighi-aba urù n'ubọchi nke nrubiga-ókè nke iwe: Ma ezi omume nānaputa n'ọnwu.


kwasienu ákwá ike; n'ihi na ubọchi Jehova di nso; dika nbibi nke sitere n'aka Onye puru ime ihe nile ka ọ gābia.


N'èzí-ya nile ka ha keworo ákwà-nkpe: n'elu ulo-ya nile na n'amá-ya nile ka onye ọ bula nākwasi ákwá ike, nākwab͕u onwe-ya.


N'ihi nka kenu ákwà-nkpe n'úkwù-unu, tienu aka n'obi, kwasi kwa ákwá ike: n'ihi na iwe di ọku nke Jehova esighi n'aru ayi laghachi.


Otú a ka Jehova siri, Ka onye nke mara ihe ghara inya isi n'amam-ihe-ya, ka dike ghara inya isi n'idi-ike-ya, ka ọgaranya ghara inya isi n'àkù-ya:


si, Gini ka nne-gi bu? Ọ bu nne-ọdum: n'etiti ọdum ka ọ makpuru, n'etiti umu-ọdum ka o mere ka umu-ya ba uba.


Nwa nke madu, bue amuma, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Kwasienu ákwá ike, si, Azib͕a ub͕ochi ahu!


Ka ihere me unu, ndi-ubi, kwasienu ákwá ike, unu ndi-ubi-vine, bayere ọka wheat, baye-kwa-ra ọka barley; n'ihi na owuwe-ihe-ubi alawo n'iyì.


Kenu ákwà-nkpe n'úkwù-unu, ti-kwa-nu aka n'obi, unu ndi-nchu-àjà; kwasienu ákwá ike, unu ndi-oje-ozi nke ebe-ichu-àjà; bianu, nọ ọnọdu-abali n'ákwà-nkpe, unu ndi nējere Chinekem ozi: n'ihi na eb͕ochiwo onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu n'ulo Chineke-unu.


Tetanu, unu ndi nāṅubiga manya ókè, kwanu ákwá; kwasi-kwa-nu ákwá ike, unu nile ndi nāṅu manya-vine, n'ihi manya utọ; n'ihi na ebipuwo ya n'ọnu-unu.


N'ihi na ndi-ọgaranya-ya juputara n'ihe-ike, ndi bi nime ya ekwuwo kwa okwu-ugha, ire-ha di kwa aghughọ n'ọnu-ha.


Ọla-ọcha-ha ma-ọbu ọla-edo-ha agaghi-enwe ike inaputa ha anaputa n'ubọchi nrubiga-ókè nke iwe Jehova; ma agēji ọku nke ekworo-Ya ripia ala-ha nile: n'ihi na ngwusi, nke bu nání obi-ọlulọ-miri, ka Ọ gēme ka ndi nile bi n'ala nka gwusia.


Jeshurun we ma abuba, we b͕a ukwu: I mawo abuba, i buwo ibù, abuba ekpuchiwo aru-gi: O we rapu Chineke nke mere ya, We kpọ Oké Nkume nke nzọputa-ya onye-nzuzu.


N'ihi na anyanwu nāwalita, ifufe di ọku eso ya, o we kpọnwua ahihia; uzari-ya we dapu, nmá nke iru-ya we la n'iyì: otú a ka ọgaranya gātalata kwa n'ije-ya nile.


Ma unu onwe-unu mere ob͕eye ahu ihe-ihere. Ǹdi-ọgaranya adighi-emeso unu dika ha bu ndi-nwe-unu? ọ̀ bughi kwa ha onwe-ha nādọkpuru unu ga ulo ikpé?


Genu nti, unu ndi nāsi, Ta ma-ọbu echi ka ayi gāga obodo a, nọ kwa n'ebe ahu otù arọ, zu kwa ahia, rita kwa urù:


Hujunu anya, ru-kwa-nu újú, kwa-kwa-nu ákwá: ka ọchì-unu ghọ iru-újú, ka ọṅù-unu ghọ kwa nb͕aru-iru.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan