Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jemis 4:4 - Bible Nso

4 Unu ndi nākwa iko, ùnu amataghi na ibu eyì nke uwa bu ibu onye-iro nke Chineke? Ya mere onye ọ bula nke zubere ibu eyì nke uwa nēdo onwe-ya onye-iro nke Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi! Ọ bụ na unu amaghị na unu na ụwa bụrụ enyi, unu ga-esi otu a bụrụ ndị iro Chineke? Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ enyi nke ụwa, na-eme onwe ya onye iro nke Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jemis 4:4
24 Iomraidhean Croise  

iro ka M'gētiye kwa n'etiti gi na nwayi ahu, na n'etiti nkpuru-gi na nkpuru-ya: nkpuru ahu gēchifia gi n'isi, gi onwe-gi gēchifia kwa ya n'ikiri-ukwu.


Aka-Gi gāchọputa ndi-iro-Gi nile: Aka-nri-Gi gāchọputa ndi nākpọ Gi asì.


Ọ buru na i hu onye-ori, ihe-ya we tọ gi utọ, Gi na ndi nākwa iko ekèkọwo kwa òkè.


N'ihi na, le, ndi nọ gi n'ebe di anya gāla n'iyì: I kpochapuwo onye ọ bula nke nāpu n'aka-Gi akwa iko.


Ma unu onwe-unu, biaruenu nso ebe a, unu umu-ndikom nke nwanyi ji igwe-oji atu isi ọma na isi ọjọ, unu nkpuru nke nwoke nākwa iko na nwanyi nākwa iko.


Je, kpọ òkù na nti nke Jerusalem, si, Otú a ka Jehova siri, Echetawom n'ebe i nọ ebere nke mb͕e i nọ na nwata, ihu-n'anya nke mb͕e aluru gi ọhu: otú i jesorom n'ọzara, n'ala anāghaghi nkpuru.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na m'nwere ebe inọ ọnọdu-abali nke ndi-ije n'ọzara; ka m'we rapu ndim, si n'ebe ha nọ la! n'ihi na ha nile bu ndi nākwa iko, nzukọ ndi-nghọb͕u.


Le nwanyi nākwa iko! mb͕e ọ nọ n'okpuru di-ya ọ nēwere ndi nābughi di-ya!


Jehova we sim, Je kwa, hu nwanyi n'anya nke iko huworo ya n'anya, nke bu kwa nwanyi aluru na nwunye nākwa iko, dika Jehova si ahu umu Israel n'anya, ọ bu ezie na ha onwe-ha nēche iru na chi ọzọ di iche iche, nāhu kwa mbadamba nkpuru-vine amiri ami n'anya.


Ma Ọ zara, si ha, Ajọ ọb͕ọ nke nākwa kwa iko nāchọ ihe-iriba-ama; agaghi-enye kwa ya ihe-iriba-ama ma-ọbughi ihe-iriba-ama nke Jona onye-amuma:


Ajọ ọb͕ọ nke nākwa kwa iko nāchọ ihe-iriba-ama; ma agaghi-enye ya ihe-iriba-ama, ma-ọbughi ihe-iriba-ama nke Jona. O we rapu ha, pua.


Ọ dighi onye ọ bula puru ibu orù nke nna abua: n'ihi na ọ gākpọ otù onye nime ha asì, hu ibe-ya n'anya; ma ọ bughi otú a ọ gējide otù, lelìa ibe-ya anya. Unu apughi ibu orù Chineke na àkù.


Otú ọ di, ndi-irom ndia, ndi nāchọghi ka m'buru eze-ha, kuta ha n'ebe a, b͕ue ha n'irum.


Ọ buru na unu sitere n'uwa, uwa gāhu ihe nke aka ya n'anya: ma n'ihi na unu esiteghi n'uwa, kama Mu onwem rọputara unu nime uwa, n'ihi nka uwa nākpọ unu asì.


Mu onwem enyewo ha okwu-Gi; uwa kpọ-kwa-ra ha asì, n'ihi na ha esiteghi n'uwa, dika Mu onwem nēsiteghi n'uwa.


Uwa apughi ikpọ unu asì; ma ọ nākpọ Mu onwem asì, n'ihi na Mu onwem nāb͕ara ya àmà, na ọlu-ya nile jọrọ njọ.


N'ihi na asi na, mb͕e ayi bu ndi-iro, esitere n'ọnwu Ọkpara-Ya me ka ayi na Chineke di n'otù: nke kariri ri nne bu, ebe emesiri ka ayi na Chineke di n'otù, na agāzọputa ayi nime ndu-Ya;


n'ihi na itukwasi uche n'anu-aru, ya na Chineke di n'iro; n'ihi na edoghi ya n'okpuru iwu Chineke, n'ihi na apughi kwa ido ya n'okpuru ya:


Òle ebe onye mara ihe nọ? òle ebe ode-akwukwọ nọ? òle ebe onye oge a, onye ya na ibe-ya nājurita ajuju, nọ? Chìneke emeghi ka amam-ihe uwa buru ihe-nzuzu?


N'ihi na ebe uwa n'amam-ihe nke Chineke nējighi amam-ihe-ya mara Chineke, ọ di Chineke ezi nma iji ihe-nzuzu nke ihe ahu anēkwusa izọputa ndi kwere.


N'ihi na ọ̀ bu madu ka m'nēme ka ha kweye ub͕u a, ma-ọbu Chineke? ma-ọbu ànamachọ uzọ ime ihe gātọ madu utọ? ọ buru na anọm nēme ihe gātọ madu utọ, m'gaghi-abuwori orù nke Kraist.


Okpukpe-Chineke nke di ọcha nke anēmerughi kwa emeru n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi, bu nka, ileta umu-nb͕ei na ndinyom di-ha nwuru nime nkpab͕u-ha, na idebe onwe-ya nēnweghi ntupọ site n'uwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan