ọ buru na ndim, bú ndi akpọkwasiri ha aham, eweda onwe-ha n'ala, kpe ekpere, chọ irum, si n'uzọ ọjọ ha nile laghachi; Mu onwem gēsi kwa n'elu-igwe nuru, b͕aghara ha nmehie-ha, me ka ala-ha diri ndu.
Moses na Eron we bakuru Fero, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Rùe ole mb͕e i gāju iweda onwe-gi n'ala n'irum? zipu ndim, ka ha we fèm.
otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Wezuga ákwà-nkukù-isi ahu, bupu okpu-eze ahu: nka agaghi-abu kwa ihe ọ bu: me ihe nke di ala ka ọ di elu, me kwa ihe nke di elu ka ọ di ala.
Asim unu, Nwoke a ridara n'ulo-ya buru onye aguworo n'onye ezi omume kari ibe-ya: n'ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ma onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu.