Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jemis 3:18 - Bible Nso

18 Ma ọ bu nkpuru nke ezi omume ka ndi nēme udo nāgha n'udo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ma ndị ahụ bụ ndị na-eme udo bụ ndị na-agha mkpụrụ udo. Ha ga-aghọta mkpụrụ ezi omume.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jemis 3:18
13 Iomraidhean Croise  

Ha gānọ nāmi nkpuru n'isi-awọ; Osisi nke miri di ha n'aru ri nne, nke nwezu-kwa-ra akwukwọ ndu, ka ha gābu.


Onye nēmebi iwu nāluta ego-ọlu okwu-ugha: Ma onye nāgha ezi omume dika nkpuru nāluta ugwọ-ọlu kwesiri ntukwasi-obi.


Onye nātukwasi obi n'àkù-ya, onye ahu gāda: Ma dika akwukwọ ndu ka ndi ezi omume gēpú.


Nkpuru onye ezi omume nāmi bu osisi nēnye ndu; Onye nēnwetara Chineke nkpuru-obi madu ka onye mara ihe bu.


Gharanu onwe-unu nkpuru n'ezi omume, wenu ihe-ubi dika ebere si di; lucharanu onwe-unu ubi: n'ihi na ọ bu mb͕e ichọ Jehova, rue mb͕e Ọ gābia, zokwasi unu ezi omume dika miri.


Inyinya, hà nāb͕a ọsọ n'elu nkume di elu? àgēji ehi dọ ihe eji gwu ala-ubi n'ebe ahu? na unu ab͕anwewo ikpé ka ọ ghọ ńsí, b͕anwe kwa nkpuru ezi omume ka ọ ghọ wormwood:


Ngọzi nādiri ndi nēme ka madu na ibe-ha di n'udo: n'ihi na ndi ahu ka agākpọ umu Chineke.


Onye nēwere ihe ubi nānara ugwọ-ọlu-ya, nāchikọta kwa nkpuru nye na ndu ebighi-ebi; ka onye nāgha nkpuru na onye nēwere ihe ubi we ṅuria ọṅu n'otù.


N'ihi na onye nāgha nkpuru nye anu-aru onwe-ya gēsite n'anu-aru ahu weta nmebi dika ihe-ubi; ma onye nāgha nkpuru nye Mọ Nsọ gēsite na Mọ Nsọ weta ndu ebighi-ebi dika ihe-ubi


ebe unu gābu ndi juputaworo na nkpuru nke ezi omume, nke sitere n'aka Jisus Kraist, ka Chineke we nwe ebube na otuto.


Ozizí nile site n'inye ahuhu nādi ka ihe nādighi-eweta ọṅù n'oge di ub͕u a, kama nwuta: ma emesia ọ nēnyeghachi ndi ahu ewereworo ya nwaputa ha nkpuru nke di n'udo, bú nkpuru nke ezi omume.


n'ihi na iwe madu adighi-alu ọlu ezi omume Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan