Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jemis 2:23 - Bible Nso

23 ewe mezu ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nke nāsi, Abraham we kwere okwu Chineke, ewe gua ya nye ya n'ezi omume; ewe kpọ ya eyì nke Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Ọ bụ site na nke a ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ jiri mezuo, nke na asị, “Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume,” kpọọkwa ya enyi Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jemis 2:23
22 Iomraidhean Croise  

Ọ we kwere na Jehova; Ọ we gua ya nye ya n'ezi omume.


Azaraia nwa Netan bu onye-isi nke ndi edoro ndi-isi; Zabud nwa Netan bu onye-isi n'ije ozi na eyì eze;


Ọ̀ bughi Gi onwe-gi, Chineke-ayi, napuru ndi bi n'ala nka ala-ha n'iru ndi-Gi, bú Israel, were ya nye nkpuru Abraham, bú onye nāhu Gi n'anya, rue mb͕e ebighi-ebi?


Ka otù onye we so Chineke ruara madu uka, Dika nwa nke madu si aruara madu-ibe-ya uka.


Jehova we gwa Moses okwu iru n'iru, dika madu nāgwa eyì-ya okwu. Ọ we laghachi n'ọmuma-ulo-ikwū ahu: ma onye nējere ya ozi, bú Joshua, nwa Nun, bú okorọbia, adighi-esi n'etiti Ulo-ikwū ahu pua.


Ma gi onwe-gi, Israel, orùm, Jekob onye M'rọputara, nkpuru Abraham, bú onye nāhum n'anya;


Ùnu agughi ọbuná ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ; Nkume nke ndi nēwu ulo juru, Nke ahu ka emere isi nkuku ulo:


Ha kpọgide-kwa-ra ndikom abua tinyere Ya ndi nāpunara madu ihe; otù onye n'aka-nri-Ya, na otù onye n'aka-ekpe-Ya.


O we malite isi ha, Ta ka emezuworo ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ na nti-unu.


Umu-nnam, ihe edeworo n'akwukwọ nsọ aghaghi imezu, nke Mọ Nsọ kwuru n'oge gara aga site n'ọnu Devid banyere Judas, onye mesiri buru onye-ndù ndi jidere Jisus.


Chineke enupughi ndi-Ya nke O buru uzọ mara. Ma-ọbu ùnu amataghi ihe ọ nēkwu, bú ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, n'ebe edeworo okwu bayere Elaija? otú ọ nāriọ Chineke aririọ megide Israel, si,


N'ihi na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nāsi Fero, Ọ bu n'ihi otù ihe a ka M'mere ka i bilie, ka M'we gosi ikem nime gi, ka ewe kwusa kwa aham n'uwa nile.


Otú ọ di, ihe edeworo n'akwukwọ nsọ mechibidoro ihe nile n'okpuru nmehie, ka ewe were nkwa ahu nke sitere n'okwukwe ekwere na Jisus Kraist nye ndi kwere ekwe.


Dika Abraham kwere Chineke, ewe gua nke ahu nye ya n'ezi omume.


Ihe ọ bula edeworo n'akwukwọ nsọ bu ihe si n'obi Chineke puta, ọ ba-kwa-ra urù iji zí ihe, na iji tu madu nmehie-ha n'anya, na iji me ka uche madu guzozie, na iji zùputa nzùputa nke di n'ezi omume:


Unu ahuwo na anēsite n'ọlu gu madu n'onye ezi omume, adighi-esite kwa nání n'okwukwe.


N'ihi na ekwuru n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, si, Le, anamatọb͕ọ na Zaion otù isi nkume nime nkuku ntọ-ala, nke bu ihe arọputara, buru kwa ihe anāsọpuru: Onye kwe-kwa-ra na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya ma-ọli.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan