Ma mb͕e onye-Farisi nke kpọrọ Ya huru ya, o kwue n'onwe-ya, si, Nwoke a, asi na Ọ bu onye amuma, Ọ gāmara onye nwanyi a bu nke nēmetu Ya aka, na aha madu ọ bu, na ọ bu onye-nmehie.
na ọ bughi nání n'okwu-ọnu ka ozi ọma ayi biaruru unu, kama ọ bia-kwa-ra n'ike, na nime Mọ Nsọ na ọtutu nkwezu; dika unu matara aha madu a huru na ayi bu n'ebe unu nọ n'ihi unu.
N'ihi na asi na onye ọ bula bu onye nānu okwu ahu, ma ọ bughi onye nēme ya, onye ahu yiri nwoke nke nēkiri iru-ya n'enyo, bú iru o nwere mb͕e amuputara ya:
Ma onye nyochaworo nime iwu zuru okè, bú iwu nke inwe-onwe-ya, nke nānọgide kwa otú a, ghara ighọ onye nānu anu nke nēchezọ, kama ọ bu onye nēme eme nke nālu ọlu, onye a gābu onye-ngọzi n'omume-ya.