20 n'ihi na iwe madu adighi-alu ọlu ezi omume Chineke.
20 Nʼihi na iwe nke mmadụ anaghị arụpụta ezi omume nke Chineke.
ma Mu onwem si unu, na onye ọ bula nke nēwe iwe megide nwa-nne-ya gēnye onwe-ya n'aka ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa nwa-nne-ya, Raka, gēnye onwe-ya n'aka nnọkọ-ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa, Onye-nzuzù, gēnye onwe-ya n'aka ọku ala-mọ.
Unu emehiela mb͕e unu nēwe iwe: ekwela anyanwu da na nkpasu-iwe-unu: