Ya mere, ndi m'huru n'anya, dika unu ṅara nti mb͕e nile, ọ bughi nání mb͕e m'nọ n'etiti unu, kama ub͕u a mb͕e m'nānọghi, werenu egwu na ima-jijiji luputa kari nzọputa nke onwe-unu nke-uku;
Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iwere ihu-amam-ihe-n'anya na aghughọ efu nke ya buru onye nēzu unu n'ori, ihu-amam-ihe-n'anya nke di ka ihe-ozizí madu nyere idebe, dika ozizí mbu nke uwa, ma ọ dighi ka Kraist si di:
Nurunu, umu-nnam ndi m'huru n'anya; Chìneke arọputaghi ndi bu ob͕eye n'ihe nke uwa ka ha buru ndi-ọgaranya n'okwukwe, buru kwa ndi-nketa nke ala-eze ahu nke O kwere nkwa inye ndi huru Ya n'anya?
Umu-nnam, unu ekwutọritala ibe-unu. Onye nēkwutọ nwa-nna-ya, ma-ọbu nēkpe nwa-nna-ya ikpé, o nēkwutọ iwu, nēkpe kwa iwu ikpé: ma ọ buru na i nēkpe iwu ikpé, i bughi onye nēdebe iwu, kama i bu onye-ikpé-ya.
Ma nke kachasi ihe nile, umu-nnam, unu aṅula iyí, unu ejila elu-igwe, ma-ọbu ala, ma-ọbu ihe iṅu-iyi ọ bula ọzọ, ṅu iyi: kama ka e-unu buru e, ka é-è-unu buru kwa é-è; ka unu we ghara idabà n'okpuru ikpé.