Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jemis 1:14 - Bible Nso

14 kama anānwa onye ọ bula mb͕e agu ihe ọjọ nke aka ya nādọkpufu ya, ewe rafue ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Kama ọnwụnwa na-abịara mmadụ site nʼọchịchọ nke obi ya. Ọ bụkwa ọchịchọ ọjọọ nke mmadụ na-arafu ya, dọkpụfuo ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jemis 1:14
24 Iomraidhean Croise  

Nwayi we hu na osisi ahu di nma ihe-oriri, na ọ bu kwa ihe nāgu anya agu ile, na ihe anāchọsi ike ka osisi ahu bu kwa ime ka madu nwe uche, o were ufọdu nime nkpuru-ya, rie; o nye kwa di-ya, tinyere onwe-ya, o we rie.


Jehova we hu na ihe ọjọ nke madu riri nne n'uwa, Ọ hu kwa na ncheputa nile ọ bula nke echiche obi-ya bu nání ihe ọjọ ogologo ubọchi nile.


Jehova we nu ísì utọ ya; Jehova we gwa obi-Ya okwu, si, M'gaghi-akọcha ala ọzọ ma-ọli n'ihi madu, n'ihi na ncheputa nke obi madu di njọ site na nwata; M'gaghi-etib͕u kwa ihe nile ọ bula di ndu ọzọ ma-ọli, dika M'meworo.


Devid we ziga ndi-ozi, kuru ya; nwayi ahu we biakute ya, ya na ya we dina; (ma nwayi ahu si n'ọrurú-ya nēdo onwe-ya nsọ,) o we laghachi n'ulo-ya.


Ewe rafue obim na nzuzo, Akam we sutu ọnum ọnu:


Ọ buru na arafue obim ijekuru nwayi, M'we che anwu n'ọnu-uzọ madu-ibem:


Kari ihe-ndebe-gi nile chebe obi-gi; N'ihi na site na ya ka nputa nile nke ndu di.


Ọ bu onye ji ntu azù onwe-ya: obi akwara emò ewezugawo ya, o we ghara inaputa nkpuru-obi-ya, ma ọbu isi, Ọ̀ bughi okwu-ugha, bú ihe di n'aka-nrim?


Ọ bu nbibi-gi, Israel, na i nēmegidem, nēmegide iye-aka-gi.


Ma ihe nke si n'ọnu puta nēsi nime obi aputa; ihe ndia nēmeru kwa madu.


ndia bu ihe nēmeru madu: ma iwere aka anākwọghi akwọ iri ihe adighi-emeru madu.


Mb͕e ahu Mọ Nsọ duru Jisus rigo n'ọhia ka ekwensu we nwa Ya.


ma Mu onwem si unu, na nwoke ọ bula nke nēle nwanyi anya ka agu ya we gua ya, ọ kwasiwo ya iko n'obi-ya ub͕u a.


n'ihi na nmehie, ebe ọ natara ihe ọ gēji megidem, o sitere n'ihe enyere n'iwu ghọb͕uem, site kwa na ya b͕uem.


Ya mere, èzi ihe ahu ghọrọ ọnwu n'ebe m'nọ? Chineke ekwela. kama ọ bu nmehie, ka o we puta ìhè na ọ bu nmehie, site n'iwere ezi ihe ahu lutaram ọnwu; ka nmehie we site n'ihe ahu enyere n'iwu ghọ ihe nēmehie nke-uku ri nne.


ka unu tupu madu ochie unu, nke nēmebi emebi n'uzọ agu nke aghughọ, dika ibi-obi-unu na mbu si di;


kama nāriọritanu ibe-unu aririọ kwa-ubọchi, n'ogologo oge a anākpọ ya Ta; ka obi onye ọ bula n'etiti unu ghara ime etili site n'aghughọ nke nmehie:


Ka onye ọ bula ghara isi, mb͕e anānwa ya, Anēsite n'aka Chineke anwam: n'ihi na Chineke bu Onye anāpughi iwere ihe ọjọ nwa Ya, Ya onwe-ya adighi-anwa kwa onye ọ bula:


Mb͕e ahu agua ihe ọjọ ahu, mb͕e ọ tuworo ime, o we muputa nmehie: nmehie ahu, mb͕e o tozuru okè, o we muputa ọnwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan