Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 9:6 - Bible Nso

6 b͕usisianu okenye na okorọbia na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke na umu-ntakiri na ndinyom: ma unu abiarula nso onye ọ bula nke akàrà ahu di ya n'iru; ma n'ebe nsọm ka unu gēsi malite. Ha we malite n'etiti ndi-okenye ndi nọ n'iru ulo ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Gbuonụ ha niile, ndị okenye, na ụmụ okorobịa, na ụmụ agbọghọbịa, na ndị inyom, na ụmụntakịrị. Ma unu emetụkwala onye ọbụla nwere akara ahụ nʼihu ya. Malitenụ nʼebe a, nʼime ụlọnsọ ukwu m.” Ya mere, ha malitere igbu ndị okenye ndị nọ nʼihu ụlọnsọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 9:6
27 Iomraidhean Croise  

Jehova we si ya, N'ihi nka onye ọ bula nke nēb͕u Ken, okpukpu asa ka agābọ ọ́bọ̀ n'aru ya. Jehova we doro Ken ihe-iriba-ama, ka onye ọ bula nke nāhu ya we ghara itib͕u ya.


O we me ka eze Kaldea rigokwasi ha, o we were mma-agha b͕ue umu-okorọbia-ha n'ulo ebe nsọ ha, o nweghi kwa ọmiko n'aru nwa-okorọbia, ma ọbu n'aru nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, ma-ọbu n'aru okenye, ma-ọbu n'aru onye kara nká: ha nile ka O nyere n'aka-ya.


N'ihi na Jehova gāgabiga iti ndi Ijipt ihe; ma mb͕e Ọ huru ọbara ahu n'elu elu-uzọ na n'elu awara-uzọ abua, Jehova gāgabiga ọnu-uzọ ahu, Ọ gaghi-ekwe onye-nbibì ahu ka ọ ba n'ulo-unu iti unu ihe.


Ha gānwu kwa, ma ndi uku ma ndi ntà, n'ala nka: agaghi-elì ha, madu agaghi-eti-kwa-ra ha aka n'obi, madu agaghi-ebì kwa onwe-ya mma, ọ gaghi-eme-kwa-ra ha isi-nkwọcha:


N'ihi na, le, ọ bu n'obodo ahu nke akpọkwasiri aham ka Mu onwem nāmalite ime ihe ọjọ, ma unu onwe-unu, ùnu gābu ndi anāmaghi ikpe ma-ọli? Unu agaghi-abu ndi anāmaghi ikpe: n'ihi na mma-agha ka Mu onwem nākpọ ka ọ dakwasi ndi nile bi n'uwa; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.


Ma ub͕u a otú a ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: N'ìhi gini ka unu onwe-unu nēme ihe ọjọ di uku megide nkpuru-obi unu, ibipu n'ulo-unu nwoke na nwanyi na nwatakiri na nwa nāṅu ara, ka ha pua n'etiti Juda, ewe me ka ọ ghara idi ndi fọduru gāfọduru unu;


n'iji ọlu nile nke aka-unu kpasuem iwe, n'isurere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ala Ijipt, ebe unu onwe-unu biaworo inọ dika ọbìa; ka ewe bipu unu, ka unu we ghọ kwa ihe-nkọcha na ihe-ita-uta n'etiti mba nile nke uwa?


Ma ọnuma Jehova juputara nimem; ike gwurum inagide ya: wukwasi ya n'aru umu-ntakiri n'èzí, na n'aru ìzù umu-okorọbia n'otù: n'ihi na agēwere kwa ma di ma nwunye, ma okenye ma onye juputara n'ubọchi ndu-ya.


N'ihi na ọnwu arigobatawo na window nile nke ayi, ọ batawo n'ulo-elu nile nke ayi; ibipu umu-ntakiri n'èzí, na umu-okorọbia n'amá nile.


Mọ Chineke we buliem, me ka m'biarue ọnu-uzọ-ama Iru-anyanwu nke ulo Jehova, nke nēche iru n'Iru-anyanwu: ma, le, n'oghere nke ọnu-uzọ-ama ahu ka orú ndikom na ise nọ; m'we hu n'etiti ha Jeazanaia nwa Azua, na Pelataia nwa Benaia, bú ndi-isi nke ndi Israel.


Jehova we si ya, Gabiga n'etiti obodo a, n'etiti Jerusalem, ka akàrà n'egedege-iru nke ndi ahu ndi nēze ume ndi nāsu kwa ude n'ihi ihe-árú nile nke anēme n'etiti ya.


Ma ndikom isi ahu ka Ọ siri na ntim abua, Sonu ya gabiga n'obodo a, tib͕u kwa: anya-unu emela ebere, unu enwe-kwa-la ọmiko:


Nání unu ka M'maworo n'etiti ab͕uru nile nke uwa: n'ihi nka ka M'gēji ajọ omume nile unu leta unu.


Ọzọ, orù ahu, nke mara ihe onye-nwe-ya chọrọ, ma o dozighi, o meghi kwa dika ọ chọrọ, agāpia ya ọtutu utari;


Ayi we were obodo-ya nile na mb͕e ahu, wezuga obodo ndikom ọ bula, ya na ndinyom na umu-ntakiri, ka ebibie ha; ọ dighi onye fọduru ayi rapuru:


Ayi we wezuga ha ka ebibie ha, dika ayi mere Saihon, bú eze Heshbon, nēwezuga obodo, ndikom ọ bula, ya na ndinyom, na umu-ntakiri, ka ebibie ya.


M'gēkpokwasi kwa ha ihe ọjọ; M'gāb͕apusi àkúm nile n'aru ha:


Otú ọ di, ntọ-ala di ike nke Chineke nēguzo, ebe o nwere akàrà nka, Onye-nwe-ayi mara ndi bu nke Ya: na, Ka onye ọ bula nke nākpọ aha Onye-nwe-ayi si n'ajọ omume wezuga onwe-ya.


Ndia bu ndi nēmerughi onwe-ha n'aru ndinyom; n'ihi na ha di ọcha ka umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Ndia bu ndi nēso Nwa-aturu ahu ebe ọ bula Ọ nēje. Ndia ka ab͕atara n'etiti madu, iburu Chineke na Nwa-aturu ahu nkpuru mbu.


si, Emejọla uwa, ma-ọbu oké osimiri, ma-ọbu osisi, rue mb͕e ayi gākasiwo ndi-orù Chineke-ayi akàrà n'egedege-iru-ha.


Ewe gwa ha ka ha ghara imejọ ahihia nke uwa, ma-ọbu ihe ọ bula nwere akwukwọ ndu, ma-ọbu osisi ọ bula, ma ka ha mejọ nání madu, bú ndi ahu nēnweghi akàrà nke Chineke n'egedege-iru-ha.


Ub͕u a je tib͕ue Amalek, wezuga ihe nile ọ bula o nwere ka ebibie ya, enwe-kwa-la ọmiko n'aru ya; kama me ka ha nwua, ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, ma ehi ma aturu, ma camel ma inyinya-ibu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan