Ha we kwe ire-ha, dika uta-ha, ib͕a okwu-ugha dika àkú; ma ọ bughi n'ebe ikwesi-ntukwasi-obi di ka ha diworo ike n'ala: n'ihi na ha esiwo n'ihe ọjọ pukuru ihe ọjọ, ma Mu ka ha nāmaghi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
O we sim, Nwa nke madu, ì huwo ihe ndi-okenye nke ulo Israel nēme n'ọchichiri, onye ọ bula n'ime-ulo nile nke ihe o mere ka ha yie ihe? n'ihi na ha nāsi, Ọ dighi Jehova nāhu ayi; Jehova arapuwo ala-ayi.
O we sim, Nwa nke madu, Gì onwe-gi nāhu ihe ha onwe-ha nēme? bú ihe-árú nile di uku nke ulo Israel nēme n'ebe a, ka M'we si n'ebe nsọm je n'ebe di anya? ma i gāhu kwa oké ihe-árú ọzọ di iche iche.