Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 8:1 - Bible Nso

1 O rue, n'arọ nke-isi, n'ọnwa nke-isi, n'ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, mb͕e mu onwem nānọdu ala n'ulom, mb͕e ndi-okenye Juda nānọdu kwa ala n'irum, na aka Onye-nwe-ayi Jehova dakwasirim n'ebe ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Nʼafọ nke isii, nʼọnwa nke isii, nʼụbọchị nke ise nke ọnwa ahụ, mgbe mụ onwe m nọdụ ala nʼụlọ m, ndị okenye Juda na-anọdụkwa ala nʼihu m, aka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dịkwasịrị m nʼahụ nʼebe ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 8:1
24 Iomraidhean Croise  

Ma Elaisha nānọdu n'ulo-ya, ndi-okenye nānọdu kwa n'ebe ọ nọ: eze we ziga otù nwoke site n'iru ya: ma tutu onye-ozi ahu abiakute ya, ya onwe-ya siri ndi-okenye, Ùnu ahuwo na nwa ob͕u-madu a ezitewo iwezuga isim? hunu, mb͕e onye-ozi ahu nābia, mechienu uzọ, were ibo-uzọ kwagide ya: òlu ukwu abua nke onye-nwe-ya adighi n'azu ya?


Ufọdu nime ndi-okenye Israel we biakutem, nọdu ala n'irum.


N'ihi nka gwa ha okwu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Onye ọ bula n'ulo Israel nke nēme ka arusi nile ya ba n'obi-ya, nke nētiye kwa ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ya na ncherita-iru ya, we biakute onye-amuma; Mu onwem, bú Jehova, gāza ya dika o si di, ya bu dika iba-uba nke arusi-ya nile si di;


O rue n'arọ nke-asa, n'ọnwa nke-ise, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, na ufọdu nime ndi-okenye Israel biara iju Jehova ase, ha we nọdu ala n'irum.


Okwu Jehova we ruem nti n'arọ nke-iteghete, n'ọnwa nke-iri, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, si,


O rue, n'arọ nke-iri-na-otù, n'ubọchi mbu nke ọnwa, na okwu Jehova rurum nti, si,


N'arọ nke-iri, n'ọnwa nke-iri, n'ubọchi nke-iri-na-abua nke ọnwa ahu, okwu Jehova rurum nti, si,


O rue, n'arọ nke-oru-na-asa, n'ọnwa mbu, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,


Mọ Chineke we buliem, m'we nu olu nke oké ùzù n'azum, si, Ihe agọziworo agọzi ka ebube Jehova bu site n'ọnọdu-Ya.


Mọ Chineke we buliem, bupum: m'we jegharia n'ilu obi, n'ọnuma nke mọm, ọzọ, aka Jehova nke di n'arum di ike.


Aka Jehova we dim n'aru n'ebe ahu; O we sim, Bilie, pua, jerue ndagwurugwu, n'ebe ahu ka M'gākpayere gi uka.


O rue, n'arọ nke iri-na-otù, n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-asa nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,


O rue, n'arọ nke-iri-na otù, n'ọnwa nke-atọ, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,


O rue, n'arọ nke-iri-na-abua, n'ọnwa nke-iri-na-abua, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,


O rue, n'arọ nke-iri-na-abua, n'ubọchi nke-iri-na-ise ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,


Ma aka Jehova rurumri aru n'anyasi, tutu onye b͕apuru ab͕apu abia; O we saghe ọnum, rue mb͕e ọ biakuterem n'ututu; ewe saghe ọnum, m'we ghara ida kwa ob͕i ọzọ.


Ha we nābiakute gi dika ọbibia nke otù ndi, nọdu ala n'iru-gi dika ndim, ha nānu kwa okwu-gi nile, ma okwu-gi ndia ka ha nēmegh: n'ihi na ihu-n'anya riri nne ka ndi ahu ji ọnu-ha egosi, ma urù-ha nke nēzighi ezi ka obi-ha nējeso.


Aka Jehova we dikwasim, O we me ka m'pua apu nime Mọ nke Jehova, O we dọbam n'etiti ndagwurugwu ahu; ma ndagwurugwu ahu juputara n'ọkpukpu;


N'arọ nke-orú-na-ise nke emere ka ayi je biri n'ala ọzọ, n'isi-nmalite arọ ahu, n'ubọchi nke-isi nke ọnwa, n'arọ nke-iri-na-anọ site na mb͕e etikpọsiri obodo-ayi, n'otù ubọchi ahu, aka Jehova dim n'aru, O we me ka m'bia n'ebe ahu.


Eze-ha gēru kwa újú, onye-isi gēyiri itọb͕ọ-n'efu dika uwe, aka nile nke ndi ala ahu gāma kwa jijiji: dika uzọ-ha si di ka M'gēme ha, M'gēji kwa ikpé nile ha kpe ha; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


M'we hu, ma, le, oyiyi dika ọku si di n'ile ya anya; site n'ihe bu úkwù-Ya n'ile ya anya we ridata, ọ bu ọku: ọzọ, site n'úkwù-Ya we rigo elu, ọ di ka onwunwu-ìhè si di n'ile ya anya, dika ib͕u-maramara amber.


N'ihi na eḅuḅere-ọnu abua nke onye-nchu-àjà gēdebe ihe-ọmuma, ọ bu kwa iwu ka ha gāchọ n'ọnu-ya: n'ihi na onye-ozi nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka ọ bu.


Agu ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo ma-ọbu uwe nke onye ọ bula agughm.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan