Le, Mu nāmu anya n'aru ha ime ha ihe ọjọ, ọ bughi ime ha nma: agēme kwa ka ndi Juda nile, bú ndi nọ n'ala Ijipt, gwusia site na mma-agha na site n'oké unwu, rue mb͕e ha gāgwusi.
N'ihi nka si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gēme ka ilu a kwusi, ha agaghi-atu kwa ya dika ilu n'Israel ọzọ; kama gwa ha okwu, si, Ha di nso, bú ubọchi ahu, ha na okwu ọhù ọ bula.
Chi-ọbubọ abiakutewo gi, gi onye bi n'ala ahu: mb͕e nke gi abiawo, ubọchi nke gi di nso; ọ bu ọb͕ub͕a-aghara, ọ bughi iti-nkpu-ọṅù, n'elu ugwu-gi nile.
O we si, Gini ka gi onwe-gi nāhu, Emos? M'we si, Otù nkata nke nkpuru-osisi nke mb͕e nghọkọta-nkpuru. Jehova we sim, Ọgwugwu abiaruwo ndim, bú Israel, aru; M'gaghi-agabiga kwa nmehie-ya ọzọ.
Teta, gi mma-agha, imegide Onye-ọzùzù-aturum, na imegide nwoke ahu nke bu ibem, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta): tib͕ue Onye-ọzùzù-aturu ahu, agāb͕asa kwa ìgwè ewu na aturu; M'gēchighari kwa akam imegide ndi ntà.
asi kwa na O mereghi uwa ochie ebere, kama ọ bu Noa, onye mere ha asatọ, bú onye nēkwusa ezi omume, ka O chere, mb͕e O mere ka iju-miri biakwasi uwa nke ndi nādighi-asọpuru Chineke;