Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 7:27 - Bible Nso

27 Eze-ha gēru kwa újú, onye-isi gēyiri itọb͕ọ-n'efu dika uwe, aka nile nke ndi ala ahu gāma kwa jijiji: dika uzọ-ha si di ka M'gēme ha, M'gēji kwa ikpé nile ha kpe ha; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Eze ga-eru ụjụ, nwa eze ga-eyikwasị ịda mba nke obi dịka uwe, aka ga-ama ndị ala ahụ niile jijiji nʼihi egwu. Aga m emeso ha dịka omume ha si dị, aga m ekpekwa ha ikpe dịka ihe ha kwenyeere si dị. “ ‘Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 7:27
22 Iomraidhean Croise  

Onye nke Chineke we biarue nso, gwa eze Israel okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N'ihi na Siria asiwo, Chi ugwu ka Jehova bu, ma Ọ bughi chi ndagwurugwu; n'ihi ya ka M'gēnye ìgwè uku a nile n'aka-gi, unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova.


Ndi nākpọ gi asì gēyi ihere dika uwe; Ulo-ikwū nke ndi nēmebi iwu agaghi-adi kwa.


O yiri-kwa-ra nkọcha dika uwe-nwuda-ya, O we ba nime ya dika miri, Ba kwa n'ọkpukpu-ya nile dika manu.


Ya diri ya ka uwe oji kpuchi onwe-ya, Ya buru kwa akpukpọ-úkwù o ji ke úkwù mb͕e nile.


Ndi nēmegidem gēyiri ọnọdu-ihere dika uwe, Ha gēwere kwa ihere-ha kpuchie onwe-ha dika uwe-nwuda.


Ka ihere me ha, ka ha nile nwe kwa iru-ihere n'otù, bú ndi na-aṅuri ọǹu n'ihe ọjọ nādakwasim: Ka ha yiri ihere na ọnọdu-ihere dika uwe, bú ndi nēme onwe-ha ka ha di uku imegidem.


Jehova emewo ka amara Ya onwe-ya, ezi ikpe ka O kpeworo: N'ọlu nke ọbu-aka-ya abua ka amaworo onye nēmebi iwu dika n'ọnyà. Higgaion. Selah


Ahuhu gādiri onye nēmebi iwu! ọ gādiri ya njọ: n'ihi na nmeso aka-ya abua mesoro madu ka agēme ya.


Ha gākasi kwa unu obi, mb͕e unu nāhu uzọ-ha na omume nile ha: unu ewe mara na ọ bughi n'efu ka M'meworo ihe ahu nile nke M'meworo nime ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


N'ihi nka ka M'gēkpe unu ikpe, unu ulo Israel, onye ọ bula ka uzọ-ya nile si di; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. Latanu, sinu na njehie nile unu chigharia; ajọ omume ewe ghara ighọrọ unu ihe-isu-ngọngọ.


Ma gi onwe-gi, onye emeruworo aru, onye nēmebi iwu, bú onye-isi Israel, onye ubọchi-ya biaworo, na mb͕e ajọ omume nke mb͕e ikpe-azu;


Ndi-isi nile nke oké osimiri gēsi n'oche-eze-ha ridata, chizuga uwe-nwuda-ha, ọ bu kwa uwe nile ha akpara nke-ọma ka ha gēyipu: ọma-jijiji nile ka ha gēyibe dika uwe; n'ala ka ha gānọdu, ma jijiji na ntabi-anya nile ọ bula, ihe-gi gēju kwa ha anya.


Ub͕u a ka ọgwugwu dikwasi gi, M'gēzite kwa iwem n'aru gi, kpe gi ikpe dika uzọ-gi nile si di; M'gētiyekwasi kwa gi ihe-árú-gi nile.


O rue, n'arọ nke-isi, n'ọnwa nke-isi, n'ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, mb͕e mu onwem nānọdu ala n'ulom, mb͕e ndi-okenye Juda nānọdu kwa ala n'irum, na aka Onye-nwe-ayi Jehova dakwasirim n'ebe ahu.


Unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Onye bi na Zaion, bú ugwu nsọm: Jerusalem ewe di nsọ, ndi ala ọzọ agaghi-agabiga kwa nime ya ọzọ.


N'ihi na ikpé unu ji kpe ka agēji kpe unu: ọ bu kwa ihe unu ji tù ihe ka agēji tùru unu.


N'ihi na ọ bu ikpé nke ebere nādighi ya ka agēkpe onye nēmeghi ebere: ebere nānyara ikpé isi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan