Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 7:26 - Bible Nso

26 Nbibi gēsochi nbibi bia, akukọ gānọchi kwa akukọ; ha gāchọ kwa ọhù n'aka onye-amuma; ma iwu gālanari onye-nchu-àjà n'iyì, ndum-ọdu gālanari kwa ndi-okenye n'iyì.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Mbibi ga-esochi mbibi, akụkọ na-enweghị isi ga-esochikwa akụkọ na-enweghị isi. Ha ga-agagharị na-achọ ọhụ site nʼaka onye amụma, ntụziaka onye nchụaja ga-akwụsị, ndụmọdụ nke ndị okenye agaghị adịkwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 7:26
26 Iomraidhean Croise  

Ayi ahughi ihe-iriba-ama nile ayi: Ọ dighi onye-amuma di ọzọ; Ọ dighi kwa onye nọ n'etiti ayi nke mara mb͕e mb͕e gēru.


Ma ihe ọjọ abiakwasiwo gi; i gaghi-ama chi-ọbubọ di ya: nbibi gādakwasi kwa gi; i gaghi-enwe ike ikpuchi anya-ya: ila-n'iyì gābiakwasi kwa gi na mberede, nke i nāmaghi.


Ha we si, Bianu, ka ayi chè èchìchè megide Jeremaia; n'ihi na iwu agaghi-esi n'ebe onye-nchu-àjà nọ la n'iyì, ndum-ọdu agaghi-esi kwa n'ebe onye mara ihe nọ, okwu agaghi-esi kwa n'ebe onye-amuma nọ. Bianu, ka ayi were ire-ayi tib͕ue ya, ma ka ayi ghara iṅa nti n'okwu-ya nile.


Biko, juara ayi Jehova ase; n'ihi na Nebukadreza, bú eze Babilon, ebusowo ayi agha: eleghi anya Jehova gēmeso ayi dika oké ọlu-Ya nile si di, we me ka o si n'aru ayi rigo la.


eze, bú Zedekaia, we ziga, kuta ya: eze we jua ya n'ulo-ya na nzuzo, si, Ọ̀ di okwu ọ bula sitere na Jehova? Jeremaia we si, Okwu di. O we si, N'aka eze Babilon ka agēnye gi.


Ntipia n'elu ntipia ka anākpọ; n'ihi na ebibiwo ala nka nile: na mberede ka ebibiworo ulo-ikwūm nile, n'otù ntabi-anya ka ebibiworo ákwà-nkwubam nile.


Ọnu-uzọ-ama-ya nile emikpuwo n'ala; O mewo ka ihe-ntuchi-ya nile la n'iyì, Ọ b͕ajiwo kwa ha: Eze-ya na ndi-isi-ya nọ n'etiti mba nile ebe iwu nādighi; Ọzọ, ndi-amuma-ya achọtaghi ọhù nke sitere na Jehova.


Ọ we sim, Nwa nke madu, ndia bu ndikom ahu ndi nēchè ajọ ihe, ndi nādu kwa ọdu ọjọ n'obodo a:


Nwa nke madu, Gini bu ilu a unu nwere n'ala Israel, si, Ha di anya, bú ubọchi ahu, ọhù nile ọ bula alawo kwa n'iyì?


Ufọdu nime ndi-okenye Israel we biakutem, nọdu ala n'irum.


Ma ọ gēru, mb͕e ha gāsi gi, N'ìhi gini ka gi onwe-gi nēze ume? na i gāsi, Ọ bu n'ihi akukọ, n'ihi na ọ nābia: obi nile ọ bula gālọ kwa miri, aka nile gākuda, ike gāgwu mọ madu nile ọ bula, ikperè-ukwu nile gāghọ miri miri: le, ọ nābia, o ruwo kwa, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ndi-nchu-àjà-ya emewo iwum ihe-ike, me ka ihe nsọm nile ghara idi nsọ: ọ dighi ókè ha kpaworo n'etiti ihe nsọ na ihe nādighi nsọ, ha emeghi kwa ka madu mara ihe di iche n'etiti ihe ruru árú na ihe di ọcha, ọ bu kwa ubọchi-izu-ikem nile ka ha zonariworo anya-ha, ewe me ka M'ghara idi nsọ n'etiti ha.


Ha we nābiakute gi dika ọbibia nke otù ndi, nọdu ala n'iru-gi dika ndim, ha nānu kwa okwu-gi nile, ma okwu-gi ndia ka ha nēmegh: n'ihi na ihu-n'anya riri nne ka ndi ahu ji ọnu-ha egosi, ma urù-ha nke nēzighi ezi ka obi-ha nējeso.


O rue, n'arọ nke-isi, n'ọnwa nke-isi, n'ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, mb͕e mu onwem nānọdu ala n'ulom, mb͕e ndi-okenye Juda nānọdu kwa ala n'irum, na aka Onye-nwe-ayi Jehova dakwasirim n'ebe ahu.


Ma ọ buru na unu agaghi-egem nti rue ihe ndia, M'gādọ kwa unu aka na nti ub͕ò asa ọzọ n'ihi nmehie nile unu.


Ma ọ buru na unu ejeghari n'imegidem, we ghara ikwe igem nti; M'gātukwasi kwa unu ihe-otiti ub͕ò asa ọzọ dika nmehie-unu nile si di.


Mu onwem gējeghari kwa n'imegide unu; M'gēti kwa unu ihe ub͕ò asa, ọbuná Mu onwem, n'ihi nmehie nile unu.


M'gējeghari kwa n'imegide unu n'ọnuma; M'gādọ kwa unu aka na nti ub͕ò asa, ọbuná Mu onwem, n'ihi nmehie nile unu.


N'ihi nka ka abali gādiri unu, unu ewe ghara ihu ọhù; ọchichiri gāb͕a-kwa-ra unu, unu ewe ghara iju ase; anyanwu gādakpute kwa ndi-amuma ahu, ubọchi ewe ji nji n'elu ha.


N'ihi na eḅuḅere-ọnu abua nke onye-nchu-àjà gēdebe ihe-ọmuma, ọ bu kwa iwu ka ha gāchọ n'ọnu-ya: n'ihi na onye-ozi nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka ọ bu.


Ma Mu onwem emewo kwa ka unu buru ndi anēlelì na ndi di ala n'iru ndim nile, dika unu nādighi-esi edebe uzọm nile, kama unu nāhu madu iru-ọma n'iwu.


M'gēkpokwasi kwa ha ihe ọjọ; M'gāb͕apusi àkúm nile n'aru ha:


Nwata ahu, bú Samuel, we nējere Jehova ozi n'iru Ilai. Okwu Jehova we di oké ọnu na mb͕e ahu; ọ dighi ọhù ekwusara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan